Ọdụ Ụgbọelu Anambra: Otu Ndị Ọrụ Ikpe Na Ndị Na-Emepụta Ọgwụ Etoola Obianọ

Jun 30, 2021 - 21:00
Jun 30, 2021 - 21:01
 0
Ọdụ Ụgbọelu Anambra: Otu Ndị Ọrụ Ikpe Na Ndị Na-Emepụta Ọgwụ Etoola Obianọ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ na-adị mma a magide àtụ, e jerup ejerou, ka ọ ga-abụ àtụ akọwachaghị, anya ahụchaa.

Ka ọ dị taa, ndị òtù ahụ jikọtara ndị ọrụ ikpe n'ala Nigeria a maara dịka 'Nigeria Bar Association' (NBA), na ndị otu nke jikọtara ndị na-emepụta ọgwụ na Nigeria, bụ 'Pharmaceutical Society of Nigeria' (PSN) etòóla aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka agadaga ọrụ dị ukwu ọ rụrụ n'ọdụ ụgbọelu mba ụwa Anambra ahụ a maara dịka 'Anambra International Cargo and Passenger Airport'.

Ndị òtù a kwupụtara otuto a oge ha gara njem nleta n'ebe ahụ a rụrụ ya bụ ọdụ ụgbọelu mba ụwa, dị n'Ụmụeri, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East', bụkwa ebe ha nọrọ wee kọwaa ya bụ ọdụ ụgbọelu dịka ọpụrụiche na ejiamaatụ, n'ilekwàsị anya n'ụdịdị ya nakwa akụrụngwa e jiri rụọ ya.

Ya bụ njem nleta, bụkwa nke Gọvanọ Obianọ; Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti Anambra, bụ Maazị Marcel Ifejiofor; onye ahụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance (APGA)' weputere maka iji aha ya zọọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo; ndị eze ọdịnala, ndịisi ụka, na ụfọdụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ sonyèrè na ya.

N'okwu ha n'ebe ahụ, onyeisioche òtù NBA, bụ Ọkaiwu Kingsley Akuka, na ògbò ya nke PSN ngalaba steeti Anambra, bụ Maazị Josephat Obasi gosipụtara ịtụnanya ha banyere ihe ha hụrụ n'ebe ahụ, ma kwupụta afọ ojuju ha banyere ya bụ agadaga ọrụ, bụ nke ha gbara akaebe na ọ bụ nke mbụ na mbụ a na-ahụta ụdị ihe dị etu ahụ na steeti ahụ.

Ha mere ka a mara na ọdụ ụgbọelu ahụ ga-adọta ọnọdụ mmepe bụ ịgbà, kwàlite ọnọdụ azụmahịa na ọnọdụ akụnụba na mpaghara ebe ahụ, na steeti Anambra nà ná mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ Nigeria ma a rụchaa ya. Ha kpekwazịrị ka Chineke gbàá ya bụ Gọvanọ ume maka ezi ọrụ ọ rụrụ na steeti ahụ kemgbe ahọ asaa gara aga, ma nyekwara ya aka ịchịkọta ọchịchị ya nke ọma.

Na mbụ n'okwu ya n'ebe ahụ Gọvanọ Obianọ kọwaara ndị òtù ahụ ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere ya bụ ọdụ ụgbọelu, ma mee ka a mara na nke kacha nke bụ na ọdụ ọgbọelu ahụ emeela ka Anambra soro na steeti olenaole nwere ọdụ ụgbọelu n'ala Nigeria, ma nwekwa ike ile ọbịa ugbua nye  nnukwu ọgbakọ mba ụwa dị iche iche ugbua, ọkachasị n'ihi ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ na nnukwu ụlọ ezumezu mba ụwa ahụ ọchịchị ya na-arụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, bụkwa nke a ga-achịkọta ọrụ na ya n'oge adịghị anya.

Dịka ọ na-ekwe nkwa na ọ ga-arụcha ọrụ niile o ji n'aka na steeti ahụ ma mezupụtachaa nkwà niile o kwere Ndị Anambra tupu oge ọchịchị ya abịa n'isi njedobe n'ahọ na-abịa abịa; ya bụ gọvanọ kèlèkwazịrị ndị òtù abụọ ahụ maka ezi ọrụ dị iche iche ha na-arụ n'obodo, ma dụọ ha ọdụ ka ha jisie ike n'ọrụ, ọbụladị dịkaọ kpọkuru ndị ahụ na-emepụta ọgwụ ka ha gbasie mbọ ike ịmàchi, imemilà na ibu agha megide ọgwụ adịgboloja.

N'okwu nke ya oge ọ na-edugharị ndị ahụ n'ebe ahụ Komishọna na-ahụ maka ọrụ, bụ Marcel Ifejiofor kọwara na ọdụ ụgbọelu ahụ nwèrè mpaghara 'runway' ogologo ya ruru kilomita 3.7, ụlọelu tawà (tower) nwere òkpùkpù iri na otu, eprọn (apron) ogologo ya ruru narị atọ, tinyere akụrụngwa ndị ọzọ mere ya ka ọ bụrụ ọkachamma na ejiamaatụ n'ala Nigeria na mba ọwụwa anyanwụ Afrịka.

O nyekwazịrị nkọwa banyere ogoogo e ji arụ ọrụ ahụ na ebe ọrụ nọ na ya ugbua, ma kọwaa ná nchịkọta nà ọrụ ọdụ ụgbọelu ahụ agafeela pasentị iri iteghete ugbua, kwupụtakwazie olileanya ya na a ga-arụcha ya n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484