Ofumelụ Achịkọbara Asọmpi Nkwàlite Mmụta n'Ayamelụm

Oct 3, 2019 - 01:23
Jan 22, 2021 - 05:39
 0
Ofumelụ Achịkọbara Asọmpi Nkwàlite Mmụta n'Ayamelụm

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Oke ọñụ dara n'okpuru ọchịchị Ayamelụm dị na steeti Anambra nso-nso a dịka otu nwa amadi ọrụ obi ebere na-echu ụra, bụ Maazị Alphonsus Ofumelụ nyèrè onyinye ego wee nyegara ụmụakwụkwọ dị iche iche nwetara nturu ùgò n'asọmpị ọ chịkọbààrà ụmụakwụkwọ nọ n'ogo sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ dị iche iche dị n'okpuru ọchịchị ahụ.

Nnukwu mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'isi obodo okpuru ọchịchị ahụ, bụ Anakụ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ selitere isi n'okpuru ọchịchị ahụ nàkwà ndị okwu ha na-ada ụdà na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ, nke gụnyere ndị ji ọkwa ọchịchị, ndị nkuzi na ndị isi ụlọakwụkwọ, ndị nne na nna, ụmụakwụkwọ na ọtụtụ ndị ọzọ, ndị bịara iji anya ha gbara ekeresimeesi.

N'okwu ya na mmemme ahụ oge ọ na-enye onye tutere ùgò dịka ọkaibe n'asọmpi ahụ ihe nrita ya, onyeisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Benjamin Onyeabọ kọwara mmụta dịka ihe dị oke mkpà n'iwulite mmadụ na obodo, ma kpọkùzie ụmụakwụkwọ ụmụ na-eto eto, ọ kachasị ụmụakwụkwọ ka ha na-agbado anya ma na-etinyekwa uchu n'agụmakwụkwọ ha oge niile. O tòkwàzịrị nwa amadi ahụ kwadoro ya bụ asọmpi, bụ Maazị Ofumelụ, maka ịghọta oke mkpà ọ dị na a ga na-akwàdosi ọnọdụ mmụta ike n'ihi oke uru nke ahụ ga-abara ụmụ mmadụ na obodo. Ọ kpọkùzịrị ndị ọzọ bụ ndị aka ji àkụ n'okpuru ọchịchị ahụ na n'obodo dị iche iche ka ha ñòmie ụdịrị nzọụkwụ ọma ahụ, site n'ịhazi ma ọ bụ ịkwàdo ụdị ọmarịcha ihe dị otu ahụ na mpaghara ha dị iche iche, n'ihi na uru dị na ime ihe dị otu ahụ bụ nke ọnụ apụghị ịkọcha.

N'okwu nke ya oge ọ na-enye onye gbara onye nke abụọ na asọmpi ahụ ihe nrita ya; osote onyeisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Icheke Anịgbọgụ kọwara Maazị Ofumelụ dịka nwoke afọ ọma na onye jikwa akụnụba ya wee na-ejere obodo, ụmụ mmadụ na Chineke ozi, ma kpọkùkwazie ụmụakwkụkwọ ahụ tuuru ùgò ka ha ghara ịga rahụba ụra maka na ha nwetara mmeri, kama ka ha hụta ya dịka ihe mwulite mmụọ, iji gụsie akwụkwọ ha ike karịa, ma nwekwa ezi akparamagwa.

Ka ọ na-enye otu onye n'ime mmadụ abụọ gbara ndị nke atọ ihe nrita ya, odeakwụkwọ ngalaba mmụta n'okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Emmanuel Makwudo kelekwara Maazị Ofumelụ na ndị òtù ọrụ ya maka ya bụ ọmarịcha atụmatụ, ma kpọkuziekwa ụmụakwụkwọ ka ha were agụmakwụkwọ ha kpọrọ ihe, site n'ịdị na-agụsi akwụkwọ ha ike, n'ihi na ọ bụ site n'ụzọ dị òtù ahụ ka ha pụrụ isi kwụghachi ya bụ nwa amadi maka afọ ọma ya, ma sikwazie n'ụzọ dị òtù ahụ bàara onwe ha, ezinaụlọ ha na obodo ha úrù.

N'ozi ekele ya, ya bụ agụ nwoke chịkọbara asọmpi ahụ, bụ Maazị Alphonsus Ofumelu, bụkwá onyeisi òtù ọrụ obi ebere 'Alphonsus Ofumelu Foundation' mere ka a mara na ihe kpaliri ya ịbagide n'ọmarịcha atụmatụ ahụ bụ iji tụnye ụtụ nke ha n'ịkwàlite mmụta n'ebe ụmụ na-eto eto nọ, ọ kachasị ndị na-eme ihe ọmụmụ nkà na ụzụ, arụmarụ, na mgbakọ na mwepù, nke nwa bekee kpọrọ 'Science, Technology, Engineering and Mathematics (STEM).'

Ya bụ oke mmadụ, ọnye kwuru okwu site n'ọnụ onye hụrụ maka nhazi asọmpi ahụ bụ Maazị Johnson Nweke tòrò ụmụakwụkwọ nwetara mmeri n'asọmpi ahụ, ma kpọkuo ndị enwetaghị mmeri ka ha hụta ya dịka ihe ịmà aka, ma gazie gụsie akwụkwọ ha ike iji kwado onwe ha nke ọma maka àgbà nke asọmpi ahụ nke ahọ 2020, n'ihi na ya ekpebiela ịdị na-emezị ya kwà ahọ.

Maazị Ofumelụ, bụ ezi nwa afọ Umerum Ayamelụm bí na mbà Canada kwùrù na ịkwàlite ezi mmụta abụghị ọrụ dịịrị naanị gọọmenti, kama na ọ bụ oke ihe chọrọ njikọ aka na ntụnye ndị nnọrọ onwe, ma, o tòkwàzịrị ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ.

Ọ dị mma nkọwàpụta na ọ bụ mmadụ abụọ gbàra ndị nke atọ n'asọmpi ahụ, ma e nyechàrà ha abụọ ihe nrita zuru èzù n'otu n'otù na-abụghị nke e kèwàrà ekewa.

Ụmụakwụkwọ nwetara mmerị n'asọmpi ahụ na ụlọakwụkwọ ha gụnyere: Maazị Peter Ọdịnaka Nwabunwanne sitere ụlọakwụkwọ 'Community Secondary School, Omor' (gbara onye nke mbụ); Nwaada Anedo Rebecca sitere ụlọakwụkwọ 'Amikwe Community Secondary School, Ọmọr' (gbara onye nke abụọ); Maazị Cornelius Onyibor sitere ụlọakwụkwọ 'Community Secondary School, Ịgbakwụ' (gbara onye nke atọ), tinyere Maazị Emmanuel Nwankwọ sitere ụlọakwụkwọ 'Mater Christi Secondary School, Ụmụmbo' (gbakwara onye nke atọ).

Ha nwètara ego ihe nrita dị N50, 000, N30, 000, N20, 000 na N20, 000 n'otu n'ótù n'ótù, ma kelee ya bụ nwa amadi kwadoro asọmpi ahụ, kpekwazie ekpere ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.