Ogun Steeti Eturula Ugo na Asọmpi Sayensi NNPC

Nov 22, 2019 - 20:19
Jan 24, 2021 - 04:53
 0
Ogun Steeti Eturula Ugo na Asọmpi Sayensi NNPC

Ibe Kelechukwu, Ibadan

Ogun Steeti emeriela na asọmpi sayensị nke ụlọọrụ mmanụ ụgbọala, NNPC, chịkọbara nke afọ 2019 maka ụlọ akwụkwọ sekọndịrị n'ala anyị niile. Steeti gbara ndị nke mbụ n'agba nke ikpeazụ na asọmpi ahụ were ọnọdụ ụbọchị Tọzdee n'isi ụlọọrụ NNPC dị na Abuja.

Nwata akwụkwọ nke si Ụlọakwụkwọ APT Scholars Universal College, Ota, Oluwatobi Ojo, gbara onye nke mbụ n'aha Ogun site n'ịnweta aka iri asatọ, ebe Mbazu Justice sitere Ụlọakwụkwọ Sekọndịrị CSMT Staff, Abakiliki dị na Ebonyi Steeti, gbara onye nke abụọ site n'akara iri asaa na ụma o nwere. Nwachukwu Ugochukwu si Ụlọakwụkwọ Dority International, Aba, Abia State, gbaziri onye nke atọ site n'akara iri asaa.

Onyeisi Ụlọọrụ NNPC, Malam Mele Kyari, kwuru na ụlọọrụ ahụ ga-aga n'ihu ịtụnye ụtụ nke nke ha n'ebe mmepe na ọganihu nke ngalaba akwụkwọ, iji were hụ na Naijiria dị ukwu. Ọ gbakwụnyere na asọmpi a bụ otu n'ime ụzọ ụlọọrụ ahụ si agba mbụ ị kwado iwulite obodo anyị.

"Ịwulite obodo na-aga n'ihu gụnyere ịchọpụta na ịhazi akara aka. Dịka ụlọọrụ, anyị na-agba mbọ ịchọpụta ndị a oge ha dị na nwata ma nyere ha aka iwulite ya nke ọma," ka o kwuru.

Dịka ọ dị, onyeisi otu Dangote, Alhaji Aliko Dangote, rịọrọ ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha tinye ume ha niile n'ihe ọ bụla ha na-eme na ndụ a dịka ndị ndu nke echi. O gara n'ihu kelee NNPC n'atụmatụ ha tinyere na ọ ga-enye aka iwulite ọtụtụ ndị sayensị n'ala anyị.

Dịka ọ na-ekwu n'aha ndị niile sonyere na asọmpi ahụ, Ojo kelere ụlọọrụ NNPC maka atụmatụ a ma kelekwaa ndị nkụzi ya na nne na nna ya maka nkwado ha. "Anam ekele NNPC maka ohere a na atụmatụ dịka nkea. Asọmpi a emela kam gụsie akwụkwọ ike. Obi bụ m sọ añụrị na abụ m onye meriri na asọmpi. A ba-ekelekwa ndị nkụzi, nne na nna m na ndị chịkọbara ya. N'ihi asọmpi a, obi kara m aka na-aga m eme nke ọma n'ule m niile".

Ụlọọrụ ahụ, na ngụpụta ya, kwuru na asọmpi ahụ bidoro na ime obodo nke okpuru ọchịchị ime obodo narị asaa na iri asaa na anọ enwere n'ala ànyị, ebe mmadụ atọ kacha mma gara n'ogogo steeti.

"N'ogogo steeti, onye kachasị mee nke ọma bụ onye gara na ngalaba akụkụ ala anyị, ebe onye meriri n'ogogo a bụ onye nwetara ego maka agụmakwụkwụ dị otu narị puku naira," ka o kwuru.

O gakwara n'ihu were kwuo na steeti dị na ngalaba akụkụ ala anyị dị iche zutere n'oge dị iche were sọkọrịta mpi n'etiti onwe ha iji were mata mmadụ atọ kacha mma ga-anọchite anya ha n'agba nke ikpeazụ.

Onye meriri ritara ịgụ akwụkwọ n'efu ruo mahadum nke ọnụ ego ya bụ puku narị naira atọ kwa afọ akwụkwọ ọ bụla, ebe onye nke abụọ na nke atọ ritara puku narị naira abụọ na iri ise na puku narị naira abụọ.

Steeti iri na asatọ sonyere n'agba nke ikpeazụ ebe steeti atọ nọchitere anya ngalaba ọchịchị akụkụ ọ bụla n'ala ànyị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.