Ọkaokwu Anambra Ebunyela Ndị Uweojii Ụgbọala Abụọ

Mar 11, 2021 - 14:14
 0
Ọkaokwu Anambra Ebunyela Ndị Uweojii Ụgbọala Abụọ
Ọkaokwu Anambra Ebunyela Ndị Uweojii Ụgbọala Abụọ
Ọkaokwu Anambra Ebunyela Ndị Uweojii Ụgbọala Abụọ
Ọkaokwu Anambra Ebunyela Ndị Uweojii Ụgbọala Abụọ
Ọkaokwu Anambra Ebunyela Ndị Uweojii Ụgbọala Abụọ

Izunna Okafor dere akụkọ

Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor nọrọ ụbọchị Wenezdee wee bunye ndị uweojii steeti Anambra ọmarịcha ụgbọala ọhụrụ abụọ, iji kwàdo ọrụ ọma ha n'ime steeti ahụ.

Mmemme inyefe ụgbọala ahụ n'aka ndị uweojii bụ nke weere ọnọdụ n'isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti Anambra dị n'Amawbia, ma bụrụkwa nke dọtara ụfọdụ ndị eze ọdịnala na ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị iche iche.

N'okwu ya banyere nke ahụ, Maazị Okafor mere ka a mara na o bunyere ndị uweojii ahụ ụgbọala ahụ dịka ótù n'ime ụzọ dị icheiche o si atụnye ụtụ n'ịkwàlite ọrụ nchekwa n'ime steeti ahụ, ma mekwa ka ndị uweojii ahụ nwee ike ịdị na-agbaga ọsọ ngwangwa n'ebe ọbụla e nwere ihe mberede maọbụ ọnọdụ ntụmadị.

Dịka ọ na-ekele Gọvanọ Willie Obianọ maka etu o sigoro nwògharịa ọnọdụ nchekwa steeti ahụ site n'iwepụta atụmatụ nchekwa dị iche iche, nke mezịrị ka steeti ahụ bụrụ ejiamaatụ n'ihe gbasaara ọnọdụ nchekwa n'ala Nigeria; Ọkaokwu ahụ kọwapụtara mkpa ọ dị ime ka nke ahụ kwụdosie ike, bụzị nke mere o jiri bunye ndị uweojii ahụ ụgbọala ahụ, iji kwàdo ezi ọrụ ha na nke Gọvanọ Obianọ n'ihe metụtara nchekwa. Ọ gwakwara ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ n'ime steeti ahụ ka ha ñòmie nke ahụ, ma tụnyekwa ụtụ nke ha n'ịkwàdo na ịkwàlite ọnọdụ nchekwa steeti ahụ.

Dịka ọ na-akpọku ndị uweojii ahụ ka ha jisie ike n'ọrụ ma na-arụkwa ya n'ụzọ iwu kwàdòrò, ọ gara n'ihu kwe ha nkwa na ya na ndị omeiwu steeti ahụ, na ọchịchị steeti Anambra ga-aga n'ihu inye ha nkwàdo zuru òkè, iji hụ na ọrụ ha na-agawanye n'ihu na steeti ahụ.

Na nzaghachi, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Monday Kuryas nyere Ọkaokwu Uchenna Okafor ekele n'ụzọ pụrụ iche maka ezi ntụnye ahụ o megoro n'ịkwàdo ọrụ ha, ya na ezi ọrụ dị iche iche ha bụ ndị omeiwu steeti ahụ na-arụ iji kwàdo ọnọdụ nchekwa steeti ahụ site n'atụmatụ iwu dị iche iche ha na-ewepụtasị.

O kwere nkwa na ndị uweojii steeti ahụ agaghị ada mbà n'ọrụ ha ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ. O jikwazịrị ohere ahụ wee kelee ndị Anambra na ọchịchị steeti ahụ maka ezi nkwàdo ha na-enye ndị uweojii, ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị omekóòmè na ndị na-ewete ala adịghị mma na steeti ahụ ka ha chegharịa maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha pụọ na steeti ahụ, n'ihi na ha bụ ndị uweojii wàtàrà ọgọdọ ma dịkwa njikere ịga n'ihu na-achụ ha ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ dịka ọ dị taa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484