Oke Dibịa Mgbọrọgwụ na Mkpakwụkwọ, Fada Arazụ Anwụọla

Dec 27, 2021 - 07:56
 0
Oke Dibịa Mgbọrọgwụ na Mkpakwụkwọ, Fada Arazụ Anwụọla

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Ótù nnukwu onye ụkọchukwu ụka Katọliik ahụ na-ewu èwù, ma bụrụkwa oke dibịa mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ, bụ Rev. Fr. Dr. Raymond Chukwunyereugwu Arazu anwụọla ka ọ gbàchàrà ahọ iri asatọ na abụọ (82).

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ Fr. Vitalis Anusionwu, bụ onye odeakwụkwọ òtù 'Congregation of the Holy Spirit (C.S.Sp.)', bụ òtù jikọtara ndị ụkọchukwu a maara dịka 'Holy Ghost Fathers', bụ onye kụpụụrụ ndị ntaakụkọ ozi na nsonso a banyere ọnwụ ya bụ agụ nwoke.

Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, Fr. Arazụ nwụrụ n'ụlọọgwụ 'Parklane Hospital' dị na steeti Enugu, n'ụtụtụ ụbọchị ụka, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Desimba ahọ 2021, ka ọ gachara ogologo oge ọ nọrọ n'àkwà ọrịa, bụgasị ọrịa sitere na nkā, n'ihi na o teela ọ lakpuru.

Ka ọ na-ekpe ka mkpụrụobi nwa amadi ahụ zuo ike na ndokwa, o kwukwazịrị na a ga-eme ka ụwa mara banyere mmemme akwamozu ya ngwangwa a hazichara ya.

Fada Arazu, onye a mụrụ n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Méè, afọ 1939, bụ nwa afọ Ihembọsị, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ekwusigo, nke steeti Anambra, ma bụkwa onye ji ọgụgụisi ya, ike nke Mụọ Nsọ, na mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ wee kpaa ike dị egwu ma zọpụtakwa ọtụtụ ndị mmadụ oge ọ nọ n'ụwa.

N'agbànyèghị na ọ bụ onye ọrụ ụka, Fada Arazu bụkwa onye ihe omenala Igbo na-amasị nke ukwuu, nke na ọ bụkwa ya bù ma na-elekọta ọfọ ụmụnna ya, bụ Otuke, Ihembọsị, wee ruo ụbọchị ọnwụ ya, tinyere ọtụtụ nnukwu ọkwa ndị ọzọ o jiri n'ụwa gbaa gburugburu tupu ọ laa mmụọ.

Gụọ maka ndụ ya n'ùjú ebe a

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484