Okere a kpụpụla Uzodinma n’ụlọikpe ọzọ maka okwu ntuliakaelu 2019

Jul 21, 2020 - 17:08
Jan 26, 2021 - 17:08
 0
Okere a kpụpụla Uzodinma n’ụlọikpe ọzọ maka okwu ntuliakaelu 2019

By Chidimma Nwogu, VON

Onye ọzọ akpụpụla Gọvanọ Hope Uzodinma nke steeti Imo ụkwụ n’ama ọzọ dịka o si metụta ntuliakaelu gọvanọ nke afọ 2019 bụ nke o wepuru n’ụlọikpe.

Ụlọikpe ukwu nọ n’Abuja nọrọ n’ụbọchị Wenezde kweta ịnụ mkpesa dị n’akwụkwọ nke otuonye ndorọndọrọ ọchịchị gbara iji chutuo Uzodinma n’oche Gọvanọ Imo Steeti.

N’akwụkwo ikpe bu akara FHC/ABJ/CS/656/20 nke ọkaiwu Kingdom Okere bụ onye fere ọkọlọtọ otu pati ‘Reform and Advancement Party (RAP) gbara, o kwuru na Hope Uzodinma ịnọ n’ọkwa gọvanọ megidere iwu n’ihi na o soghi zọọ ntuliaka 2019 n’aha pati ọbụla.

Okere chọrọ ka ụlọikpe kọwa ma ọ bụ Hope Uzodinma ka APC nyere nkwado ịzọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka e mere na steeti ahụ n’afọ 2019.

O gwara onye ntaakụkọ Igbo n’ekwentị na akwụkwọ ahụ ya gbara gbadoro ụkwụ na “Uzodinma na-achị Imo Steeti n’ụzọ iwu na-akwadoghi. Uzodinma azọghị ọkwa gọvanọ.”.

Ọ sị na mkpebi ụlọikpe kachasị nyere nke kwuru na ọ bụ Uche Nwosu ka APC họpụtara n’ezie ka ọ fee ọkọlotọ ha na ntuliaka gọvanọ, ebe ọ bụkwa ụlọikpe kachasi kwukwara na Nwosu agaghị abụ onye na-anọchite pati abụọ; APC na AA n’otu ntuliaka maka ọkwa gọvanọ.

Okere rịọrọ ụlọikpe ka ha tụlee ikpe ahụ ngwangwa n’ihi na dịka o siri kwuo, okwu ahụ bụ okwu dị mkpa.

Mana ọkaikpe Inec bụ Alhassan Umar, riọrọ ka e nye ha ohere iji saa okwu n’ikpe ahụ.

N’ịtụnye ọnụ n’ikpe ahụ, Jọstis Okon Abang yigharịrị ya n’ụbọchị Julaị 20, afọ 2020 bụ oge o kwuru a ga-anụ mkpesa ahụ.

N’ọsịsa ha, ọnụ na-ekwuru Uzodinma bụ Ogwuike Nwachukwu si na akwụkwọ ahụ agbara bụ njem e ji azụ aga,

“Ọ bụ njem enweghị ebe ọ na-eduga, nrọ nwakanchi”

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.