Omenala: Ndị Enugwu-Ukwu Emeela Emume Isu Evo

Aug 21, 2019 - 20:47
Jan 22, 2021 - 05:35
 0
Omenala: Ndị Enugwu-Ukwu Emeela Emume Isu Evo

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ịma mma nke ọnatarachi ndị Igbo na ọdịbendi bụ nnọọ nke pụtara ìhè nso-nso a, dịka ndị obodo Enugwu-Ukwu dị n'okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra merùbèrè emume Isu Evo, bụ otu n'ime omenala pụrụ iche e ji mara obodo ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-agọ ọjị na mmemme ahụ, eze ọdịnala Enugwu-Ukwu, bụ Igwe Ralph Ekpeh kpọkùrù ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu ka onye ọbụla tinye aka ma tụnyekwa ụtụ nke ya n'ichekwa omenala na ọnatarachi dị iche iche e ji mara ndị Igbo, baụ nke ọtụtụ n'ime ha na-anwụzị anwụ ugbu a. O kwuru na ndị ọbụla nwere omenala e jiri mara ha, bụkwa nke ha kwesiri ka na-emesi ya ike ma na-akwalitekwa ya n'ogoogo mba ụwa; ọbụnadị dịka ọ kọwara na mmemme Isu Evo nke ogbè Avomimi bụ mmemme e ji egosi na ọ fụdụzịrị naanị ụbọchị iri na abụọ ka e mee Olili Ọnwa Asatọ ndị Enugwu-ukwu.

Anyị ga-echeta na ọ bụ n'ime izuụka ole na ole gara aga ka ndị obodo a mere mmemme Ịkpọ Ji Enugwu-Ukwu bụkwa otu oke mmemme ọzọ e jiri mara obodo ahụ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Bonị Ọzọnkwụakụ gụpụtasịrị ọtụtụ uru dị iche iche dị n'ichekwa njirimara na omenala ndị, na ime ya ka ọ bụrụ nwata tote o tokwuru, ma kelekwazie ndị ogbe Avomimi maka ịtụchapụsị ụfọdụ ihe dị iche iche megidere okwukwe ndị otu Christ na mmemme ahụ, nke mezịrị ka ọtụtụ ndị mmadụ, ma ndị ụka na-esonyesizị ike na ya ugbu a.

N'okwu ha n'otu n'otu, ode akwụkwọ n'obi eze obodo ahụ, bụ Maazị Frank Nwokike, na onyeisi òtu jikọtara ndị nze na ọzọ Avọmimi, bụ Maazị Ignatius Okoye, kọwara ihe ya bụ mmemme pụtara, rụtụkwa aka n'otu e si eme ya, ma kpọkuzie ụmụ na-eto eto ka ha na-agbadosi anya ike iji hụ na njirimara na omenala obodo ha anyụghị ka ọkụ n'aka ha n'oge nke ha.

Emume Isu Evo bụ emume na-edubanye ndị obodo Enugwu-ukwu na mmemme Olili Ọnwa Asatọ, ma bụrụkwa mmemme pụrụ iche ndị Avomimi ji ekele Chineke maka ahọ ọrụ gara aga ma kpekwara ya maka nke ahọ na-abịa abịa, tinyere ọganihu obodo ahụ na ụmụ afọ ya n'izugbe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.