Ọnọdụ Nchekwa: Gọọmenti Anambra Na Ndị Keke Enweela Ọgbakọ

Nov 12, 2020 - 15:50
Jan 30, 2021 - 15:50
 0
Ọnọdụ Nchekwa: Gọọmenti Anambra Na Ndị Keke Enweela Ọgbakọ

Izunna Okafor

Ọchịchị steeti Anambra nọrọ ụbọchị Wenezdee wee nwee ọgbakọ, ha na ndị na-anyà ụgbọala Keke Napep n'ime steeti ahụ.

Ya bụ ọgbakọ bụ nke weere ọnọdụ n'ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n'Awka, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee tụlee ma tinye okwu ọnụ banyere ihe metụtara òtù ahụ, mpụ na arụrụala, nakwa ọnọdụ nchekwa steeti ahụ.

N'okwu ya n'ọgbakọ ahụ, odeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu gbarụrụ ihu banyere etu arụrụala na ihe ọjọọ si na-achọzịkwa ịbawanye ụba na steeti ahụ, bụ nke o kwuru na ọtụtụ n'ime ha bụ nke ndị na-eme ya na-eji Keke were eme, dịka izu ohi, ịtọrọ mmadụ, ịgba égbè/ịgbagbu mmadụ, ịma aka àkpa, na ụfọdụ arụrụala na ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche.

Ọ kpọkuru ndị na-anyà keke na steeti ahụ ka a debànye aha n'usoro 'Anambra State Transport Management Code' (ATMC), n'ihi na nke ahụ ga-enye aka ịma onye bụ onye. Ọ gwakwara ndị ahụ ka ha nye aka ịkpọpụtasị, ikwupụta na ime ka a mara ndị bụ ajọ mmadụ n'ime ha, iji si n'ụzọ dị etu ahụ bèlata arụrụala dị iche iche na-arịzị ibè ya elu ugbua. Ọ gwakwara ha na ọ bụrụ na ha emeghị nke ahụ, maọbụ kwụsị iji keke arụ arụrụala, ị mara na gọọmentị ga-amachi keke ịgba na steeti ahụ

N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ahịa na azụmahịa, bụ Maazị Uchenna Okafor kwupụtàrà na a màchiela ụtụ niile ha bụ ndị keke na-atụ kwà ọnwa na steeti ahụ, ma gwakwa ha na gọọmenti ga-elebà anya n'ihe dị iche iche metụtara maọbụ na-akpa ha, iji mee ihe banyere ya.

Na ntụnye nke ya, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n'ihe gbasaara nchekwa, bụ Chikaodili Anara gwàrà ndị ahụ na-anya keke ka ha họpụta ụfọdụ n'ime ndị isi ọrụ òtù ahụ iji wepụta usoro bụ ịgbà maka ịchọpụta na ịchụpụta ndị ahụ bụ ndị ọjọọ nọ n'ime ha na-arụ arụrụala dị iche iche.

A nọkwazịrị ebe ahụ kàá ọgbakọ ọzọ ga-ewere ọnọdụ n'obi gọọmenti steeti ahụ ụbọchị Mọnde n'etiti gọọmenti steeti ahụ na ụfọdụ ndị isi ọchịchị òtù ahụ jikọtara ndị na-anya keke na steeti Anambra.

Ya bụ ọgbakọ gụnyèrè ụfọdụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba nchekwa n'ime steeti ahụ, tinyere ndị na-anyà keke sitere mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ wee bịa sonye na ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.