Ọnọdụ Nwaanyị Ajadụ n'Ala Igbo (1)

Jun 16, 2021 - 21:16
 0
Ọnọdụ Nwaanyị Ajadụ n'Ala Igbo (1)
Ebe ụmụada na-akpụ nwaanyị ajadụ isi

Izunna Okafor dere edemede a

Ọnwụ bụ eézè a ma na onye ọbụla ga-echirịrị n'ụwa. Ụfọdụ na-anwụ na nwata, ụfọdụ na-anwụ n'okenyè, maka na onye ụwa ga-azarịrị chi ya òkù mgbe ọbụla o jiri kpọọ ya. 

Ọnwụ niile a na-ewute nke ukwuu, ọ sọgodi ya bụrụ na onye ahụ nọrọ ogologo ndụ ka Methuselah nke akwụkwọ nsọ tupu ọ laa mmụọ; maka na ndị nke onye ahụ agaghị ahụzịkwa ya anya ọzọ n'ụwa a. 

Nke kacha nke bụ na ọnwụ ọbụla na-ewèta oghere n'ezinụlọ ma na-ewètekwa mgbanwè ihe ụfọdụ n'ezinụlọ ahụ, n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ. Ọnwụ ọbụla na-emetụtakwa ndị ezinụlọ onye ahụ n'ụdị dị iche iche. 

Kaosiladị, n'ime ọnwụ niile a nà mmetụta ha na-enwe n'ebe ndị ezinụlọ ya nọ, nke kacha njọ bụ mmetụta ọnwụ nwoke na-enwe n'ebe nwunye ya nọ, nà ihe dị iche iche na-eso ya, ọkachasị n'ilegara anya etu nwaanyị si eru uju ọnwụ di ya, na ihe dị iche iche nwaanyị na-agabiga ma di ya nwụọ.

A bịa na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria, iji maa atụ, e nwere usoro dị iche iche ụmụnwaanyị si eru uju ọnwụ di ha. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ obodo na-emezigharịzị usoro nke ha ugbua ka ọ kawanye mma n'ihi oge ọgbaraọhụrụ a nọ na ya ugbua. Kaosiladị, ụfọdụ na-emekwa nke ha ka ọ kawanye njọ.

N'ala Yoruba, ọ bụrụ na nwoke nwụọ n'ezinụlọ, e mechaa mmemme akwamozu ya, nwunye ya ga-enwe ihe na-akpọ nkewàpụ iru uju (mourning seclusion), bụ nke ọ ga-anọ na ya abalị asaa. N'ime nke ahụ, ọ gaghị apụkwa àpụ, saa ahụ, gbanwèé ákwà ya maọbụ chọọ mma. Dàbere n'akụkụ ala Yoruba ebe ihe ahụ mere, a na-akpụkwa nwaanyị ahụ isi oge ụfọdụ. Ọ bụkwa naanị n'ala nkịtị maọbụ n'ute ka ọ ga na-anọ; ọ gaghị anwa ànwà dina n'àkwà maọbụ n'oche, ma n'ehihie, ma n'abalị.

Ọ bụrụ na nke ahụ gachaa, nwaanyị ahụ ga-abànyezị n'ohe iru uju kpọmkwem, bụ nke ga-ewè ihe ruru ọnwa anọ, ọnwa ise, isii maọbụ karịa, dịka o siri dị n'akụkụ ala Yoruba ahụ. N'ụfọdụ akụkụ ala Yoruba, ọ bụ efere kụwara akụwa ka nwaanyị ahụ ga-eji na-eri nri. Ọ bụkwa ite kụwara akụwa ka a ga-eji na-esiri ya nri.

Ọ bụrụ na nke ahụ gachaa, a na-emezịrị ya omenala ịchịkọta iru uju, bụ nke a na-eme site n'ịsa ya ahụ n'ime abalị ma o bechaara di ya nwụrụ anwụ ákwá ikpeazụ; tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ a na-emegasị iji wèta iru uju ahụ na njedobe. O ruo n'echi ya ọ chịkọtara iru uju ahụ, a na-eduru ya wee pụọ ahịa. 

Dịka nchọcha e mere siri kọwaa, ihe ndị Yoruba ji etinye nwaanyị di ya nwụrụ n'ụdị ọnọdụ iru uju ahụ bụ ka mkpụrụobi di ya wee zuo ike na ndokwa ma ghara inye nsogbu. Ọzọkwa bụ ka nwaanyị ahụ wee gosi na aka ya adịghị n'ọnwụ di ya; ya na ka e wee mara ma nwaanyị ahụ ọdị ime tupu di ya anwụọ. Ọ bụrụ n'oge mbụ, nwaanyị ahụ ruchaa uju ọnwụ di ya, nwanne nwoke di ya na-ekuchi ya ka ọ bụrụzie nwunye ya, ma wèghárakwa akụnụba niile di ya hapụrụ wee laa mmụọ, bụ atụmatụ a maara dịka "Osupo" n'ala Yoruba. 

Kaosiladị, ụfọdụ ihe ndị ahụ agbanwèbela nwayọ-nwanyọ ugbua, maka ụka, ịgụ akwụkwọ, ịwa anya, mmepe obodo, na ihe ndị ọzọ. Nke ahụ wee bụrụ etu ụmụnwaanyị si eru uju di ha na ihe ha na-agabiga n'ala Yoruba ma di ha nwụọ.

N'ala Hausa, e nwekwàrà ihe dị iche iche nwaanyị na-agabiga ma di ya nwụọ, n'ụdị iruru ya uju. Iji maa atụ, nwaanyị di ya nwụrụ ga na-anọ n'ime ụlọ, ọkachasị n'ime ụlọ ya na di ya. A ga-eburu ihe dị iche iche nwaanyị ahụ jiri wee bịa ije di ahụ, bụ ihe ndị be ha jiri wee duo ya obi ụbọchị ahụ ọ lụrụ di, gaa debe ha n'ebe ọ gaghị na-ahụ ha anya, bụkwa ebe ha ga-adịgide wee ruo mgbe o ruchara uju ọnwụ di ya. Ọ gaghị na-achọkwa mma n'ụdị ọbụla maọbụ jiri ncha na-ekpò íkpò ọma (ncha na-esi isi ọma) wee na-asa ahụ oge ahụ ọ na-eru uju di ya. Ọ gaghị akpà isi ya maọbụ buru isi a kpàrà akpà oge ọ na-eru uju. A ga-ejikwa akanwụ wee saa ya isi. Ọ ga-ejikwa 'maiyafi' wee na-ekpuchikwa isi ya ekpuchi oge niile.

Tupu nwaanyị ahụ abàá n'iru uju ahụ, ọ ga-eme omenala ịsa ahụ iru uju, bụ nke ọ ga-emerịrị n'ụbọchị Fraịdee. Ọ ga na-emekwa omenala ịsa ahụ ahụ ụbọchị Fraịdee ọbụla, ma na-ekpekwa ekpere dị na mpaghara akwụkwọ Koran (Qur'an) ebe e nyere ya ka ọ na-ekpe, oge ọbụla ọ na-asa ahụ ahụ. Ọ bụkwa n'ọnụ ụtụtụ Fraịdee ka ọ ga-eji na-asa ahụ ya, ma bụrụkwa nke ọ ga-eji mmiriọkụ wee na-asa. Ọ sachaa ahụ, ọ baa n'ime ụlọ, wèré mmanụ tee n'ahụ ya.

Nwaanyị na-eru uju di ya n'ala Hausa bụ ọgọdọ ochie kara nka ma sikwa ike ka ọ na-amà. Ọ bụrụ na o nwere ụdị ọgọdọ ahụ abụọ, o nwere ike na-agbanwe ya ma ọ bụrụ na nke ọzọ ruo unyi. Mana ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu ka o nwere, ọ gaghị na-agbanwe ya agbanwe; ọ ga-amàgide otu ọgọdọ ahụ wee ruo mgbe o ruchara uju. Kaosiladị, o nwere ike na-asụ ya asụ. Mana ọ ga-erurịrị abalị asaa tupu ọ sụọ ya. Ọ bụkwa naanị n'ụbọchị Fraịdee ka ọ ga-enwe ike ịsụ ya, maọbụ gbanwèé ya ma ọ bụrụ na o nwere abụọ.

N'ala Hausa, nwaanyị ruchaa uju, ụlọ ya anaghị adịzịkwa ka ọ dị na mbụ oge di ya nọ ndụ, maka na ọ ga-eresisi ihe dị iche iche e jiri wee duo ya obi ụbọchị a bịara lụrụ ya, maọbụ o bunyesie ya ụmụnne ya, ndị enyi ya maọbụ onye ọzọ ọ chọrọ, maọbụkwanụ ọ hapụ ha n'ime ụlọ, n'ejighị ha mee ihe ọbụla. O nwee nke dị ya mkpa, ọ gaa ahịa goro nke ọhụrụ. 

Nwaanyị na-eru uju di ya n'ala Hausa nwèrè ike ịpụ àpụ, gaa rụọ obere ọrụ; mana ọ gaghị eje mmemme ọbụla. O nwèkwàrà ike ịta ọjị ma rie ezigbo nri oge ọ na-eru uju. Nwaanyị di ya nwụrụ nwèkwàrà ike ịlụgharị di ma ọ chọọ, maọbụ ọ nọrọ be di ya zụba ụmụ ya. Ị ma na ọ na-adị mma kama ewu ga-abà n'ubi mebie ihe, ya nọrọ n'ụlọ taba nri. Nke ahụ wee bụrụkwa ọnọdụ nwaanyị di ya nwụrụ n'ala Hausa.


N'ala Igbo, ị nụ na ube jiri, ọ gbàrà mkpá n'ihe gbasaara ọnọdụ nwaanyị di ya nwụrụ. 

Dịka ihe dịbara gboo n'ala Igbo, nwaanyị ọbụla di ya nwụrụ nwègàsịrị ihe dị iche iche ọ ga-eme, ihe a ga-eme ya, na ihe ọ ga-ezèré ime. Ọtụtụ oge, ọ bụrụ na nwaanyị nwụọ, a na-enyògodi ya ènyò ka a ga-asị na ọ bụ ya gburu di ya, maọbụ nà aka ya dị n'ọnwụ ya. Ụfọdụ àgbụrụ n'ala Nigeria na-emekwa otu ihe ahụ mgbe ụfọdụ; iji maa atụ, ndị Yoruba na-emekwa ya. N'ihi onyìnyó ahụ a na-enyo nwaanyị ahụ maọbụ ebubo a na-ebo ya na ọ bụ ya na ọ bụ ya gburu di ya, a na-agwa ya ka ọ ñụọ iyi oge ụfọdụ. Ọ bụ ụmụnne di ya na-emekarị ihe ahụ, ọkachasị ọ bụrụ na nwaanyị ahụ na di ya nwèrè okwu maọbụ obere nsogbu oge ọ nọ ndụ.

Ihe kacha njọ ebe a bụ na ọ bụghị n'arụsị ka a na-akpọkarị nwaanyị di ya nwụrụ were aga ka ọ ñụọ iyi na ọ bụghị ya gburu di ya. Nke a bụ maka na a na-adị echèbé na nwaanyị ahụ gwọrọ ọgwụ ndarụiyi, nke na ọ ñụọ iyi n'arụsị, iyi ahụ agaghị egbu ya. N'ihi nke a, ọ bụ mmiri e jiri wee saa ozu nwoke ahụ ka a na-asị nwaanyị ahụ ñụọ dịka iyi, iji gosi na ọ bụghị ya gburu di ya. Ma nwaanyị ahụ ọ chọrọ ma ọ chọghị, ọ ga-añụrịrị mmiri ahụ e jiri saa ozu, maka na a na-amanye ya amanye na ọ ga-añụrịrị ya. Mgbe ụfọdụ, a na-ejidekwa ya gbàá ya mmiri ahụ àgbàá.

Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ ñụchaa mmiri ahụ, o nwee ka ọrịa siri wee rịaba ya, o wee nwụọ, a ga-asị na ọ bụ ya gburu di ya, ma mee ya ihe a na-eme onye mere arụ maọbụ onye gburu ọchụ n'ala Igbo; ọsọgodi ya bụrụ na nwaanyị ahụ nwụụrụ onwe ya, maọbụ na ọrịa a sapụtara na ahụ ozu ahụ gburu ya. Mana ọ bụrụ na ọ ñụchaara mmiri ozu ahụ, e wee hapụ ya ruo abalị olenaole, ọ bụrụ na ọ nwụghị, a mara na ọ bụghị ya gburu di ya. Oge ụfọdụ, a naghị ekwekwa ya ka ọ pụọ apụọ ma ọ ñụchaa mmiri ahụ, ka e wee mara na ọ gà-ànwụ. N'ụfọdụ obodo, a na-akpọchibidokwa nwaanyị ahụ n'ime ụlọ, ruo mkpụrụ ụbọchị olenaole.

O ruo ụbọchị a ga-akwa ozu di ya kpọmkwem, a na-atụ anya nwaanyị ahụ ga-eberịrị ákwá nke ukwuu, ma ọ chọrọ ibe akwa ma ọ chọghị. A na-atụ anya na ọ ga-ebe ákwá, ma na-atụ onwe ya n'ala, nke na ụmụnwaanyị ibe ya ga-abịazị n'eji ya eji. Ọ bụrụ na o beghị ákwá maọbụ bee ya etu a tụrụ anya, ndị mmadụ, ọkachasị ụmụọkpụ na-ebido inyò ya ènyò na aka ya dị n'ọnwụ di ya. 

Ụbọchị ahụ a na-emekwa mmemme akwamozu di ya, a ga-ejide nwaanyị ahụ ma jiri agụba maọbụ ihe ọzọ ruru aka wee kpụọ ya isi. Ọ bụ ụmụọkpụ/ụmụada na-akpụ nwaanyị ahụ isi, ma bụrụkwa nke a na-akpụ ya n'abalị n'ụfọdụ obodo n'ala Igbo. N'ụfọdụ obodo n'oge gboo, a na-asakwa nwaanyị ahụ àhụ n'èzí ma a kpụchaa ya isi, nke na ọ bụ naanị etu ha siri gbaa ya okirikiri bụ mkpuchiọtọ ọ na-enwe ebe ahụ a na-akpụ ya isi na mbara ezi. Ihe ọtụtụ ji akpụ isi bụ na ha kwenyere na ọ bụ di nwaanyị bụ ùgwù ya, nke na ọ bụrụ na a chọọ di ya a hụghị, ị mara na a ga-akpụ ya isi, iji gosi na ùgwù ya àdàálá n'ala.

N'ụfọdụ obodo n'ala Igbo, nwaanyị di ya nwụrụ bụ n'ala nkịtị ka ọ na-anọ, ma oge ahụ a na-akpụ ya isi ma ogologo oge niile ọ ga-anọ n'iru uju ahụ; a naghị ekwekwa ya ka ọ nọrọ ọdụ n'oche maọbụ dina n'àkwà. N'obodo Ozu Abam dị n'okpuru ọchịchị Arọchukwu nke steeti Abịa, ọ bụrụ na a kpụchaa nwaanyị ahụ isi, ọ ga-aga na mmiri na-ehu èhù wee saa ahụ ya, iji sapụ 'adịghịọcha ya'. A naghị akpụkwa nwaanyị ajadụ isi ka ọ maa mma n'anya, maka na a na-akpụkàsị ya akpụkasị. A na-agbachi ime ụlọ ya na di ya agbachi oge ahụ ọ na-eru uju.

Ụmụnwaanyị ajadụ n'ụfọdụ obodo na-emekwa ihe a na-akpọ ịkwa ákwá ụtụtụ oge ha na-eru uju ọnwụ di ha, nke pụtara na ha ga na-akwa ákwá n'ọnụ ụtụtụ ụbọchị ọbụla, bụkwa ákwá ọ ga-eji óké olu wee kwaa, nkè na onye ọbụla nọ na gburugburu ga-anụ mkpu ákwá àrịrị ya, iji gosi ụwa na ọ na-eru uju ọnwụ di ya. Iji maa àtụ, ọ bụrụ n'Afikpo dị na steeti Ebonyi, nwaanyị ahụ na-ebe ákwá ahụ ugboro abụọ n'ụbọchị; o bechaa n'ụtụtụ, o bee ọzọ n'oge mgbede. Ọ ga-emekwa nke a wee ruo izuụka atọ, maọbụ abalị iri abụọ na asatọ. Ndị Afikpo anaghị ekwekwa ka nwaanyị di ya nwụrụ saa ahụ, taa atụ, maọbụ gbanwee ákwà ya wee ruo abalị iri abụọ na asatọ.

Na mgbe gboo, oge ụlọ nchekwa ozu adịbeghị, a na-amanye nwaanyị ajadụ ka ọ na-arahụ ụra n'akụkụ ozu di ya n'ime ụlọ ebe e debede ozu ya ma a gbasìchaa ya. Ọ bụkwa n'akụkụ ozu di ya ahụ ka ọ ga na-anọ wee ruo ụbọchị a ga-eli ya. Nke ahụ bụ iji kwanyere di ya ahụ ùgwù ikpeazụ ma nọdèbékwa ya nke ikpeazụ. N'Ọzụbụlụ, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ekwusigo nke steeti Anambra, a na-amanyekwa nwaanyị ahụ ka ọ kpụọ afọ n'elu ozu di ya. Nwaanyị ahụ agaghị agakwa ahịa wee ruo ihe dịka otu ọnwa.


Edemede a ga-amitekwa oge ọzọ, oge anyị ga-anọ wee tọsàkwuo ya mà maa ya akpụ. Chebiri anyị!

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484