Ọnwụ egbuola Maazị Elaịja Commings

Ọnwụ egbuola Maazị Elaịja Commings

Oct 17, 2019 - 18:36
Jan 19, 2021 - 18:37
 0
Ọnwụ egbuola Maazị Elaịja Commings
: :
playing

Onye nnọchite anya ndị Baltimore n’ụlọ nzukọ omebe iwu mba Amerịka, bụ Maazị Elaịja Commings, anwụọla. Nwa amadị ahụ nwụrụ n’isi ụtụtụ taa bụ Tọzdee, n’ụlọ ọgwụ John Hopkins, site n’ahụ mgbu nke O nwere kemgbe.

Tupu yabụ nwoke anwụọ, Maazị Commings gbara afọ 68. Ndị omebe iwu ibe ya, tụmadị ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Demokrat nọzị n’iru uju, n’ihi na Commings bụ ezigbote mgbọrọgwụ n’usoro imebe iwu n’Amerịka.

Commings so na ndị omebe iwu mba Amerịka kamgbe afọ 23 gara aga.

Tupu ọnwụ egbuo ya taa, Commings bụ onye isi oche otu n’ime kọmitii atọ ndị na-eme nnyocha gbasara akparamagwa nrụrụ aka na iri ngo nke Donald Trump, onye isi ala Amerịka, na mmekorịta mba Yukren.

Nnyocha ahụ a na-eme ugbu a nwere ike ime ka a chụtuo Trump n’ọkwa. Kambge afọ ole n’ole, aka ọrụ Commings pụtara ihe dịka otu n’ime ndị isi ojii gbagolitere n’ọchịchị n’ala Amerịka.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Amerịka na-ezigara nwunye nwa amadị ahụ, bụ Maya Rockeymoore Commings, na ndị ezi n’ụlọ ya, ozi nkasi obi, na-asị ka Chineke nabata mkpụrụ obi ya na ndokwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.