Onye Ara Etiena Onye Ụkọchukwu Gwoo Gwoo Na Kogi

Sep 11, 2017 - 10:01
Jan 23, 2021 - 18:18
 0
Onye Ara Etiena Onye Ụkọchukwu Gwoo Gwoo Na Kogi

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Otu onye ara a ma ama na steeti Kogi nọrọ ụnyaahụ weeṅtie onye ụkọchukwu gwoo gwoo ma menyekwa ya ihere dị egwu n'ihu. Nke ahụ bụ n'ihi na ya bụ onye ụkọchukwu kwechiiri ma kpebie na ọ ga-achụpụrịrị ya bụ nwoke ajọ mmụọ n'isi, ma ọ chọrọ ya ma ọchọghị ya, n'ihi na akwụkwọ nsọ nyere ya ikike banyere mmụọ ọjọọ na mmụọ ara niile.

Otu onye ara a ma ama na steeti Kogi nọrọ ụnyaahụ weeṅtie onye ụkọchukwu gwoo gwoo ma menyekwa ya ihere dị egwu n'ihu.

Nke ahụ bụ n'ihi na ya bụ onye ụkọchukwu kwechiiri ma kpebie na ọ ga-achụpụrịrị ya bụ nwoke ajọ mmụọ n'isi, ma ọ chọrọ ya ma ọchọghị ya, n'ihi na akwụkwọ nsọ nyere ya ikike banyere mmụọ ọjọọ na mmụọ ara niile.

Onye akaebe nọ mgbe ya bụ ihe mere kwuru na ya bụ onye ụkọchukwu ụka ọgbara ọhụụ na-emekarị ihe ahụ oge ọbụla, na ọ na-ejekwa mgbe ụfọdụ kpọta ndị ahụ zuru oke ma gwa ha ka ha na-eme ka ndị ara na-agba, ka ọ ga-abụ o kpeere ha ekpere, ha adaa n'ala,  tụrụgharịa dịka ndi amụma na-ebu, ma blite kwuo n'ahụ adịna ya.

Mana ụbọchị ahụ bụụrụ ya ajọ ụbọchị dịka onye ara ahụ kụpụrụ ya ajọ mmụọ n'anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.