Onye Igbo Ọbụla Kwesiri Iji Asụsụ Ya Na-Eme Ngala — Nworah

Mar 1, 2021 - 21:56
 0
Onye Igbo Ọbụla Kwesiri Iji Asụsụ Ya Na-Eme Ngala — Nworah

Izunna Okafor

A dụọla Ndị Igbo ọdụ ka ha were asụsụ ha kpọrọ ihe, jiri ya na-eme ngala, ma na-asụsikwa ya ike oge niile, dịka otu n'ime ụzọ a pụrụ isi wee chekwaba ya bụ asụsụ ka ọ ghara ịnwụ, ma nyefèkwa ya n'aka ọgbọ na-abịa abịa.

Onyeisi ụlọ mgbasa ozi 'Anambra Broadcasting Service' bụ Maazị Uche Nworah bụ ya kpọrọ òkù a n'okwu ọ gwara Ka Ọ Dị Taa n'isi ụlọọrụ ya dị n'Ọka (Awka) banyere ụbọchị asụsụ ọdịnala na mba ụwa (International Mother Language Day) nke ahọ 2021, nakwa ọnọdụ asụsụ Igbo nọ na ya taa.

Dịka o siri kọwaa, ụbọchị ahụ bụ ụbọchị pụrụ iche e wepụtara iji merube asụsụ ọdịnala na ndị na-asụ asụsụ ọdịnala na mba ụwa gbaa gburugburu, ya na ịkọwa mkpà ọ dị ịkwàlite asụsụ ọdịnala. O kwuru na asụsụ bụ 'isi a hụrụ kwaba okpu' n'omenala obodo ọbụla, bụ nke mere o jiri dị mkpa ka agbụrụ ọbụla kwàdo, kwalite ma na-echekwaba nke ha oge niile, ka o wee ghara ịnwụ maọbụ fuo.

O kọwara na ámụmá ahụ òtù UNESCO buru sị na asụsụ Igbo ga-anwụ tupu ahọ 2050 bụ nke adabàghị adabà (n'agbanyeghị na ha buru ya bụ ámụmá site na nchọcha ha mere), ma kwupụtazie ezi olileanya o nwere na asụsụ Igbo agaghị anwụ, n'ihi na a ka nwere nde kwuru ndè ụmụafọ Igbo ndị ka nwere mmasị n'asụsụ ahụ ma na-akwalitekwa ya, ma n'ala Nigeria ma na mba ofesi.

Dịka ọ na-ekele ụlọ mgbasa ozi ABS maka ịkwalite asụsụ Igbo site n'ihe mmemme ha dị iche iche, o kelekwara ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation maka ịmalite mbipụta akwụkwọ akụkọ asụsụ Igbo a maara dịka Ka Ọ Dị Taa, ma kelekwa BBC Igbo nà ụlọọrụ mgbasa ozi ndị ọzọ maka mgbasa ozi ha n'asụsụ Igbo, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ụlọọrụ ndị ọzọ esonyebeghị n'ime nke ahụ n'ala Igbo ka ha malite ime ya, n'ihi na nke ahụ so n'otu ụzọ a pụrụ isi wee chekwaa ya bụ asụsụ.

Ọ katọrọ ma gbarụọ ihu banyere akparamagwa ụfọdụ Ndị Igbo ndị na-ekwu na asụsụ Igbo na-eme ha ihere, ma kọwaa na oge agaala mgbe a na-ahụta ndị na-asụ asụsụ Igbo dịka ndị amaghị akwụkwọ.

Nworah, onye kobere foto ebe o jiri ejiji Onye Igbo n'ime ụlọọrụ ya, kwùrù na ọtụtụ ndị mmadụ amaghị aha bekee ya, mee ka a mara na ọ na-eji ejiji dịka onye Igbo oge niile ma na-asụkwa asụsụ ya oge niile, nke na-egosi na ọ hụrụ asụsụ na omenala ya n'anya dịka onye Igbo. O kwukwara na ihe dị etu ahụ bụ ihe a na-atụ anya ya n'aka onye Igbo ọbụla, n'ihi na onye Igbo kwesiri iji asụsụ ya na-eme ngala.

Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ uru dị na mmadụ ịsụ asụsụ ọdịnala ya, kelee gọọmenti steeti Anambra maka ezi atụmatụ dị iche iche o wepụtagoro iji kwalite asụsụ na omenala Igbo, ma kpọkuzie ndị nne na nna, ndị nkuzi, ndị isi ụka, ndị ndu obodo, ụlọọrụ na òtù dị iche iche na onye ọbụla bụ onye Igbo ka o sonyesie ike, nye aka, ma tụnye ụtụ nke ya n'ịkwàlite asụsụ na omenala Igbo, maka na ọ na-abụ e jikọọ aka wee buo ozu enyi, ọ dị mfe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484