Onye na-eme ngagharị iwe ajago Donald Trump flagụ mba Rọshịa

Onye na-eme ngagharị iwe ajago Donald Trump flagụ mba Rọshịa

Oct 24, 2017 - 18:46
Jan 19, 2021 - 18:46
 0
Onye na-eme ngagharị iwe ajago Donald Trump flagụ mba Rọshịa

Otu nwoke onye mba Amerịka na-eme ngagharị iwe nọrọ n’isi obodo Amerịka bụ Washington, taa bụ abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọkụtoba, kpọọ oku n’olu ike ka e kpee onye isi ala mba Amerịka ikpe maka inyere ndị Rọshịa aka n’igwu ojoro n’oge atụm vootu Amerịka gara aga.

Nwoke ahụ aha ya bụ Ryan Clayton chebiri Trump n’ogige Capitol Hill, ụlọ ọrụ ndị omebe iwu nke mba Amerịka.

Mgbe Trump na onye isi oche Sineti Amerịka, bụ Mitch McConnell, na-agafe, Ryan chịịrị flagụ ndị mba Rọshịa na-aja Trump. Ka ọ na-eme nke a, ọ saghepukwere ọnụ ya malite tiwe mkpu n’oke olu. Ọ na-ekwu n’olu bekee Trump is treason!, nke pụtara na Trump bụ onye arụrụala n’olu Igbo.

Ụnụ ga-echete na a na-ebo Trump na ndị otu ya ebubo na ya na ndị Rọshịa gbakọrọ aka were gwuo ojoro mere Trump jiri merie Hillary Clinton na ntuli aka ahụ e mere na mba Amerịka n’afọ gara aga.

Kamgbe ahụ ndị Amerịka mechara nhọpụta onye isi ala, ndị Amerịka ka na-eme nyocha. E mechara họpụta onye ọkaikpe pụrụ ịche, bụ Robert Mueller, onye ka na-eme nyocha maka nrụrụ aka ahụ a na-eme Trump na ndị Rọshịa ebubo ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.