Onye obiakpọ agbagbuona mmadụ 26 na Tegzas

Onye obiakpọ agbagbuona mmadụ 26 na Tegzas

Nov 6, 2017 - 18:39
Jan 19, 2021 - 18:39
 0
Onye obiakpọ agbagbuona mmadụ 26 na Tegzas

Taa bụ Sọndee, abalị 5 nke ọnwa Nọvemba, otu nwata nwoke onye Amerịka, jere gbuo mmadụ 26 n’ụlọ ụka First Baptist Church, na Sutherland Springs, na Steeti Tegzas.

N’ihe dịka elekere iri na otu na ọkara, nwata nwoke ahụ gbara afọ 26, buru egbe agha gawa n’ụlọ ụka ahụ. Ọ bara n’ime ụlọ ụka, ebe ndị mmadụ na-efe Chineke, malite ịkwa mgbọ aghara aghara.

Otu n’ime ndị nwụrụ anwụ bụ nwata nwanyị dị afọ 14, nnwa Frank Pomeroy, onye Ụkọchukwu na-elekwata ụlọ ụka ahụ.

Mmadụ 26 nwụrụ anwụ. Ịhe karịrị mmadụ 20 marụrụ ahụ.

Ndị uwe ojii ekwuona na mgbe nwata nwoke ahụ kpachara arụ ahụ, sizie n’ụlọ ụka ahụ na-apụ, otu nwoke ọzọ bidebere ụlọ ụka ahụ nso malitere gbawa ya egbe.

Nke a mere o jiri gbaba n’ịme ụgbọala o jiri bia ebe ahụ, were bọrọ ọsọ.

Ndị uwe ojii kwuru na ha mechara chọta ya ebe ọ nwụrụ anwụ n’ime ụgbọala ya.

Anyị amatabeghị otu o siri nwụọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.