Onye Ọrụ Ugbo Anambra Eturula Ugo Dịka Ọkaibe n'Atụmatụ Ọrụ Ugbo CBN ACGSF 2020

Mar 26, 2021 - 22:49
 0
Onye Ọrụ Ugbo Anambra Eturula Ugo Dịka Ọkaibe n'Atụmatụ Ọrụ Ugbo CBN ACGSF 2020
Onye Ọrụ Ugbo Anambra Eturula Ugo Dịka Ọkaibe n'Atụmatụ Ọrụ Ugbo CBN ACGSF 2020
Onye Ọrụ Ugbo Anambra Eturula Ugo Dịka Ọkaibe n'Atụmatụ Ọrụ Ugbo CBN ACGSF 2020

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu onye ọrụ ugbo na-ewu èwù n'Ifite-Ọgwarị dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ayamelum nke steeti Anambra, bụ Maazị Anthony Nnubuonye eturula ugo ma nweta onyinye nkwanyeùgwù dịka ọkaibe n'ọrụ ugbo n'atụmatụ CBN ACGSF 2020, nke a maara dịka 'Central Bank of Nigeria and the Board of Agricultural Credit Guarantee Scheme Fund' nke ahọ 2020.

Nturuugo ahụ bụ nke Maazị Nnubuonye, onye nwe ogige ọrụ ugbo (Sheriff Farms) nwètara dịka ọkaibe n'ime ndị ọzọ sonyere n'atụmatụ ahụ, site n'ịbụ onye kacha wee mezupụta atụmatụ ọrụ ugbo ahụ, nwee ezi ndekọ bụ ọkachamma banyere etu ọrụ ugbo ya siri gaa, ma nwekwa mmepụta na owuwe ihe ubi kachasị mma, iji kwụghachi ego mgbazinye ahụ e nyere ya site n'atụmatụ ahụ na ọmụrụnwa dị n'elu ya tupu ụbọchị ikpeazụ e nyere maka ịkwụghachi ya.

N'okwu ya na mmemme inye nkwanyeugwu ahụ, onyeisi ụlọakụ etiti ala Nigeri bụ 'Central Bank of Nigeria (CBN)', ngalaba ya nke Awka, bụ Maazị Benedict Maduagwu kọwara na inye onyinye nkwanyùgwù ahụ bụ n'ịgbaso ntụziaka òtù nlekọta atụmatụ ahụ na onyeisi na-ahụ maka ngalaba ego; ma kọwaa na ya bụ atụmatụ akwalitela ọrụ ugbo, mmepụta ihe ugbo, akụrụngwa e ji akọ ugbo na ihe ndị ọzọ n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche.

Maazị Maduagwu, nke ọ bụ onyeisi ngalaba ụlọọrụ ya na-ahụ maka ego nkwalite mmepe, bụ Oriakụ Bridget Okparaeke nọchitere anya ya na mmemme ahụ kwuru na atụmatụ ahụ na-enyekwa aka n'ọtụtụ ụzọ ime ka Nigeria nwee nri gbaanyụụ, mee ka ọtụtụ mmadụ nwee ọrụ na ebe ha si enweta ego, belata oke ọnụego a na-ere nri, ma kwalitekwa ọnọdụ akụnụba ala Nigeria na ọnọdụ obibindụ ụmụafọ Nigeria.

Dịka ọ na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha sonyesie ike n'ọrụ ugbo, ọ gakwara n'ihu gwa ndị obere ụlọakụ ka ha na-agbazinye ndị na-arụ ọrụ ugbo ego, iji kwalite mmepụta nri.

N'okwu ya na mmemme ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti ahụ, bụ Maazị Nnamdi Onukwuba kelere CBN maka ọmarịcha atụmatụ ahụ, bụ nke ọ kọwara na ọ ga-enye aka ime ka ndị na-arụ ọrụ ugbo nwee ike ịgbaziri ego n'enweghị mgbakasịahụ maọbụ ihe mkpọbiụkwụ ọbụla. O kwere nkwà na ụlọọrụ ya ga-aga n'ihu ijikọ aka ọnụ, ya na ụlọọrụ ndị ọzọ dị iche iche, iji kwalite ọrụ ugbo, kwàdo ndị ọrụ ugbo, ma sikwazie n'ụzọ dị otu ahụ gaa n'ihu n'ịkwalite mmepụta nri na steeti ahụ. 

N'okwu nke ya, ya bụ nwa amadi tuuru ugo, bụ Maazị Ndubonye mere ka a mara na obi bụ ya sọ añụrị banyere nke ahụ, ma kọwaa na onyinye nkwanyeùgwù ahụ bụụrụ ya nnukwu ihe agbamume n'ụzọ pụrụ iche.

O kelere gọọmentị steeti Anambra na ụlọakụ CBN maka atụmatụ ahụ na ọmarịcha atụmatụ ndị ọzọ ha na-ewepụtagasị iji kwàdo ọrụ ugbo na ndị ọrụ ugbo, ọkachasị dịka o siri metụta ịgbaziri ego. Ọ kpọkuzịkwara ndị ọrụ ugbo na ndị ọzọ nwere mmasị n'ọrụ ugbo ka ha were ọtụtụ ohere ọma na atụmatụ ọma ahụ gọọmentị na-ewepụtasị ugbua wee kpọrọ ihe, jiri ha kwàlite ọrụ ugbo ha, ma sikwazie na nke ahụ mee ka nri bụrụ 'atụrụ taba' n'ala Nigeria.

Otu n'ime ihe pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ bụ inye ya bụ nwa amadi tuuru ugo, bụ Maazị Nnubuonye onyinye nkwanyeùgwù ahụ kpọmkwem, asambodo so ya na ọkpụrụkpụ ego dị otu narị puku naịra (N100, 000) dịka ihe nrita ya.

Atụmatụ CBN ACGSF, nke ebumnobi ya bụ iji kwàlite mmepute nri n'ala Nigeria, bụ nke e guzobere site n'atụmatụ iwu 'Decree 20' nke ahọ 1977 ma bụrụkwa nke a malitere itinye n'ọrụ na imezùpụta ya n'ọnwa Epure nke ahọ 1978. 

Ya bụ atụmatụ nke e jiri ọkpụrụkpụ isi ego dị ijeri naịra atọ (N3b) wee malite, nwezịrị ọkpụrụkpụ isi ego dị ijeri naịra ise (N50) ugbua, ma bụrụkwa nke nyegoro ego mgbazinye karịrị otu narị ijeri naịra, iri abụọ na abụọ, na ụma narị isii na iri atọ na abụọ (N122.632b) nyegara ndị ọrụ ugbo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484