Onyeisi Ndi Uwe Ojii Ọhụụ n'Anambra Ekwuo Ihe Ọ Ga-Elebà Anya. ■ Dụọ Ndị Otu Nzuzo Ka Ha Chọọ Ụzọ Ha

Feb 13, 2019 - 22:13
Jan 21, 2021 - 22:13
 0
Onyeisi Ndi Uwe Ojii Ọhụụ n'Anambra Ekwuo Ihe Ọ Ga-Elebà Anya. ■ Dụọ Ndị Otu Nzuzo Ka Ha Chọọ Ụzọ Ha

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Kọmishọna ọhụụ e wètara maka ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ maazị Danduara Mustapha ekwuola na ya ga-agbasi mbọ n'ịhụ na e nwere ezi nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ, dụọ ndị otu nzuzo na ndị na-ebute ala adịghị mma ka ha rie adụ dụọ onwe ha, ma rịọkwa ka e nwee ezi mmekọrịta n'etiti ọhznaeze na ndị uwe ojii, iji rụọ ọrụ ha nke ọma na n'ụzọ pụrụ kwesiri ekwesi.

Maazị Mustapha mere ka a mara nke a n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n'isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii na steeti ahụ dị n'Amawbịa, bụ ebe ọ nọrọ wee kọwaa na ya onwe ya bụ onyeisi ndị uwe ojii nke iri abụọ e zitegoro na steeti ahụ, ma ñụọ iyi na ọ ga-ebusò mpụ na arụrụ ala agha ma hụ na o memìlara ha kpam-kpam.

N'ihe gbasaara nhọpụta izùgbe ahụ a na-akpụdòbe nso nso a n'ala anyị, maazị Mustapha mere ka a mara na ya enweghị onye ma ọ bụ otu ndọrọ-ndọrọ ọbụla ya na-akwàdo, kwuo na a ga-enwe ezi nchekwa ndụ na akụnaba n'oge nhọpụta ahụ, kwee nkwà na a ga-eme ya bụ ntụli aka n'ezi ụzọ ghe anya oghe na steeti ahụ, ma dọkwazie ndị na-egwu okwe ndọrọ-ndọrọ aka na ntị ka ha gbaa ya bụ egwu n'ùsòrò ma zeere ihe ọbụla ga-ebute ma ọ bụ sukanye nsògbu n'ụdị ọbụla, n'ihi na onye ọbụla e jidèrè n'ihe dị otu ahụ bụ onye a ga-akpụpụ ụlọ ikpe ma were usoro iwu wee nyụchaa ya anya. Ọ dụrụ ndị òtù ọrụ ya ka onye ọbụla n'ime ha dị úchu n'ọrụ ya ma zèére ihe ọbụla bụ ịna aka azụ n'ụdị ọbụla n'ihi na nke ahụ abụrụla mbà a gara aga.

N'ihe gbasaara òtù nzúzo, maazị Mustapha kwùrù na ya ga-agbaso ụkpụrụ na nzọ ụkwụ nke onyeisi ndị uwe ojii pụrụ apụ ugbu a na steeti ahụ, bụ maazị Garba Umar malite n'ebe ọ kwụsịrị, wee buo agha hụ na e mimìlara ma wetakwa ihe ọbụla bụ otu nzuzo n'isi njedobe na steeti ahụ, dịka ọ kọwara na nke ahụ so n'ihe na-ebute ala adịghị mma n'obodo.

Ka ọ gwachara ndị nta akụkọ okwu, nwa amadi ahụ màlitezịkwara ọrụ ya n'uju site n'ibu ụzọ garuo n'ebe ahụ ebe ahụ ụgbọala na-ebu mmanụ ọkụ dàrà n'Amawbịa n'isi ngwụcha izu ụka agara aga ma binwuru ọkụ, ma gbuo, o pekata mpe, mmadụ asatọ, bụ ebe ọ nọrọ wee kọwaa ihe mberede dịka nke jọgburu onwe ya, ma kwuo na a ga-achọ ihe a ga-eme, ka ohere na efè sara mbara wee dịkwuo na mpaghara ebe ahụ.

O sizịkwa n'ebe ahụ wee ga kpọtụrụ aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ n'ebe obibi ya dị n'Amawbịa, bụkwa onye nabatara ya nke ọma ma kwe ya nkwà nkwàdo gọọmenti steeti ahụ n'ozuzu òkè iji hụ na ọrụ ya gara siriri werere.

Maazị Danduara Mustapha bụ onye a mụrụ na steeti Kastịna n'abalị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị ahọ 1963, ma bụrụ onye malitere ọrụ ya n'izugbe dịka onye uwe ojii n'abalị atọ nke ọnwa Maachị n'ahọ 1990.

O nweela ọtụtụ ọzụzụ ma nweta nzèré dị iche iche, ma n'ala Nigeria ma na mba ofesi, jie ọtụtụ ọkwa ma rụọ ọrụ n'ọtụtụ ebe na steeti dị iche iche n'ala anyị dịka onyeisi. Ebe ikpeazụ ọ rụrụ ọrụ tupuu e zite ya Anambra dịka onyeisi ndị uwe ojii bụ na 'Railway Command, Lagos' bụ ebe o ji ọkwa dịka ọga kpatakpata na ya bụ mpaghara.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.