Ooni Etoola Igbo Maka Udo Naijiria

Nov 24, 2019 - 21:02
Jan 24, 2021 - 04:37
 0
Ooni Etoola Igbo Maka Udo Naijiria

Ibe Kelechukwu , Ibadan

Onyeeze Ọdịnala, Ooni nke Ife, Oba Adeyeye Ogunwusi, etoola ịgba mbọ ndị Igbo n'ebe udo Naijiria dị. Dịka ọ kọwara Igbo dịka nnukwu mba, Ooni kpọkuru udo n'etiti ụmụ Naijiria agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ ekpemekpe. O kwuru na obodo dị na otu ga-enwe udo na ọganihu.

Ooni bụ onye kwuru nkea na nsonso a n'emume Eri nke Enugwu Aguleri, Anambra Steeti mere ụbọchị Satọdee. Onye eze ahụ, bụ onye Asoya nke Ile Isoya Ife, Oba Murainu Adebanjo, nọchitere anya ya, kwuru na obi bụ ya sọ añụrị ịsonye na mmemme ahụ, ebe ọ kọwara Ndị Igbo dịka nnukwu mba.

"Ihe gbasara ọnọdụ udo ala anyị na-amasị m maka ọ ga-eweta udo ma wepụtakwa nke kachasị mma n'ime ndị mmadụ nke ga-apụta ìhè na ọganihu ala anyị, ebe ezi nchekwa na obi añụrị ndị mmadụ ga-abụ ihe akwadoro nke ọma."

Na mmemme ahụ, Onyeisi Ọhaneze Ndị Igbo, Nna Nwodo, kwuru na alaeze Eri emela ụmụ Igbo eze site na mmemme ahụ. Ọ kọwara ọbịabịa eze ọdịnala, Ooni nke Ife, dịka ezi mmekọrịta ga-eweta udo nke gafere Niger site n'akụkụ ọdịnala.

Eze Chukwuemeka Eri kwuru na mmemme ahụ bụ oge ndị Igbo ji abịakọrịta ọnụ iji were cheta nna nna ha, bụ Eri, nke bụ ebe Igbo siri pụta, onye siri na Israel were bịa biri na Aguleri were mụbaa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.