'Operation Kpochapụ' Nke Abụọ Ga-Echighata n'Anambra -- Obianọ

Apr 24, 2019 - 22:07
Jan 21, 2021 - 22:07
 0
'Operation Kpochapụ' Nke Abụọ Ga-Echighata n'Anambra -- Obianọ

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Aka na-achị steeti Abambra bụ gọvanọ Willie Obianọ emeela ka a mara na otu n'ime atụmatụ ibu agha megide ndị omekome, bụ nke a kpọrọ 'Operation Kpochapụ' agba nke abụọ ya ga-amalitekwa na steeti ahụ oge adịghị anya.

Gọvanọ mere ka a mara nke a oge ọ gara ịkasì ndị ezinaụlọ ọnyeisi ọchịchị obodo Nimo, bụ maazị Anthony Igboka lagoro mmụọ obì na be ya dị na Nimo, n'okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ katọrọ dịka nke jọgburu onwe ya, ogbugbu ahụ e gburu ya bụ nwa amadi site n'aka ndị agameebù, bụ ndị jiri egbe wee sụọ ya kọtọkọtọ n'ahịa Oye Nimo n'abalị iri na isii nke ọnwa Epure. O mere ka a mara na ndị ọrụ uwe ojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-eleba anya ma na-eme nnyocha banyere ogbugbu ahụ, iji nwụchikọọ ndị arụrụ ala ahụ kụrụ ya bụ akụmakụ.
O kwuputara na atụmatụ nchekwa na steeti ahụ ka bụkwa nke kacha mma n'ala Nigeria gbaa gburugburu, ma sịkwazie na a ga-anwụchikọrịrị ndị ahụ, na-agbanyeghị ebe ha zòrò ma ọ bụ ogologo oge ole o werè.

Gọvanọ Obianọ gakwazịrị n'ihu kwuo na e nweghị ebe mgbaba ma ọ bụ ebe nzuzo ọbụla dịịrị ndị omekoomè na steeti ahụ, ma kwukwazịe na atụmatụ 'Operation Kpochapụ' ahụ ga-enye aka n'ụzọ dị ukwuu ikpochapụ ndị arụrụ ala ahụ, bụ ndị jikwa nwayọ nwayọ arịpụtasịkwa ọzọ ugbu a.

N'okwu nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Njikọka nke abụọ n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ maazị Pete Ibida kwùrù na ndị ọgbọ nta nkwàdo ya na ndị Nimo niile na-ekele gọvanọ Obianọ maka itinye ọnụ ozigbo na ya bụ okwu ma mekwa ihe pụtara ìhè banyere ya, ọ kachasị ịmapụta ego dị nde Naịra ise dịkwa ụgwọ ọrụ dịịrị onwe ọbụla ga-agba ezi àmà a pụrụ iji nwụchikọọ ndị ahụ gburu ya bụ nwoke

O tòkwàrà gọvanọ n'ihi ndị òtù dị iche iche o zitegooro ha kemgbe ihe ahụ mere, na-agbanyeghị na ọ nọghị nso oge ahụ, ma kwekwazie nkwà na ha ga-aga n'ihu n'ezi nkwado ahụ ha na-enye ọchịchị ya, iji wee gaa n'ihu n'ọrụ ọma dị iche iche o ji n'aka na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.