Operation Kpochapụ: Obianọ Ekwe Nkwà Ibunye Ndị Uwe Ojii Akụrụngwa Ọhụụ Echi

Oct 10, 2019 - 01:28
Jan 22, 2021 - 05:58
 0
Operation Kpochapụ: Obianọ Ekwe Nkwà Ibunye Ndị Uwe Ojii Akụrụngwa Ọhụụ Echi

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Igbo sị na ọ na-abụ a na-egbu awaị, ọ na-atọ ụtọ, a na-abachawanye ji, maka na ọ na-adị mma nke e mèrè mma kwòchaa, e mee ọzọ.

Ka ọ dị taa, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwuwaala na echi ga-abụ nnukwu ụbọchị pụrụ iche na ngalaba ọrụ nchekwa steeti ahụ, dịka ọchịchị ya ga-agbape agba nke abụọ nke amụma 'Operation Kpochapụ' ma bunyekwa ndị uwe ojii na ndị ọrụ nchekwa na steeti ahụ akụrụngwa ọhụụ bụ ịgbà, iji mee ka ọrụ nchekwa siwanye ike na ya bụ steeti.

Aka na-achị achị bụ Obianọ kwuputara nke a n'ụlọ nkwari akụ 'Golden Tulip' dị n'Agụlụ n'okpuru ọchịchị Anaọcha, oge ọ na-agbape nnukwu ọgbakọ ọzụzụ mkpụrụ ụbọchị anọ na-aga n'ihu ugbua maka ndị na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na steeti iri atọ na isii e nwèrè n'ala Nigeria, tinyere isi obodo ala anyị, bụ FCT Abụja, bụ nke a kpọrọ 'Police Public Relations Officers’ Conference'

Dịka ọ na-akọwa na nchekwa ndụ na akụnụba so n'ọrụ mbụ dịịrị gọọmenti ọbụla, Gọvanọ Obianọ kọwara ngalaba nchekwa dịka ngalaba dị oke mkpa na steeti, obodo ma ọ bụ ụlọ ọrụ ọbụla; were ohere ahụ tòó ndị uwe ojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ dị iche iche nọ na steeti Anambra maka ezi ọrụ ha ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ. Ọ nọkwàzịrị n'ebe ahụ wee kwunwèé mkpebi ahụ na nkwà ahụ o kwèrè na ọchịchị ya ga-aga n'ihu n'ịkwàdo ngalaba ahụ, bụ nke mere o jiri goo ya bụ akụrụngwa ọhụrụ pụrụ iche site na Boston nke mba United States nke America, bụ nke o kwùrù na o nwebèghị steeti ma ọ bụ gọọmenti mba ọbụla na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka goorola ụdị akụrụngwa ahụ.

Ọ kpọkuzịrị ndị mmadụ ka ha kwụsị ikwutọ ndị uwe ojii ma ọ bụ ịhụta ha dịka ndị ọjọọ, kama, ka ha were ha mere ndị enyi n'ịrụ ezi ọrụ, n'ihi na a ka nwekwara ọtụtụ ndị ezigbo mmadụ n'ime ha, na-agbanyeghị na ụfọdụ ndị ọjọọ nọkwa n'etiti ha.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi ndị uwe ojii n'ala anyị, bụ Maazị Adamu Mọhammed kwuru na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji nyegharịa ndị uwe ojii ahụ ọzụzụ ga-enyere ha aka n'ịrụ ọrụ ha otu o siri zi ezi na n'ikwesi ntụkwàsịobi, ma sikwazie n'ụzọ dị otu ahụ kwalite ezi ọnọdụ nchekwa, ma mgbanwekwa otu ndị mmadụ si ahụta ndị ọrụ uwe ojii, ọbụnadị dịka ọ kpọkuru ha bụ ndị uwe ojii na-agabiga ọzụzụ ahụ ka ha were ohèrè ọma ahụ mụta ihe ga-abara urù ma kwàlitekwa ọrụ ha, ọ kachasị site n'ịmụta usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụụ.

Maazị Adamu, nke ọ bụ onyeisi ndị uwe ojii na-elekọta mpaghara 'Zone 9' Ụmụahịa, bụ Maazị Baba Tijani nọchitere anya kelere Gọvanọ Obianọ maka nkwàdo ọchịchị ya na-enye ndị uwe ojii na ọrụ nchekwa na steeti ahụ, ma kelekwa ya maka ikweta ka steeti Abambra búó ma lee ọbịa na nnukwu mmemme ahụ, bụkwa nke o kwuru na o nwebeghị gọọmenti ma ọ bụ steeti ọbụla na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị megoro ụdị ihe dị otu ahụ ma ọ bụ búó ya bụ ọgbakọ kemgbe ahọ 1930 e jiri hibe ọrụ uwe ojii n'ala anyị; ọbụbadị dịka ọ kpọkùru ya ka o jide ka o ji.

Na ntụnye nke ya, onyeisi òtù ahụ jikọtara ndị nta akụkọ n'ala anyị, bụ 'Nigerian Union of Journalist (NUJ)' Maazị Christopher Isiguzo kpọrọ òkù ka a kwàlitekwuo ezi mmekọrịta dị n'etiti ndị uwe ojii na ndị nta akụkọ n'ala Nigeria, n'ihi na nke ahụ ga-enye aka ịme ka ndị mmadụ mara ihe dị iche iche na-emegasị na gburugburu ha dịka o siri metụta ọnọdụ nchekwa, ma nyekwa aka belata ịgbasa ozi adịgboloja.

Ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze n'ala anyị, bụ 'Nigerian Institute of Public Relations (NIPR)' bụ Maazị Mukhtar Zubairu Sirajo; onyeisi ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ Maazị John Abang; ndị nnọchi anya òrụ agha ala anyị na òtù ọrụ nchekwa ndị ọzọ dị iche iche, tinyére ọtụtụ ndị ọzọ.

A nọrọ na mmemme ahụ wee nye Gọvanọ Obianọ nkwanye ugwu site n'aka ndị uwe ojii ala anyị, iji sị ya jisie ike n'ịgbà ahụ na-ada ụda ọ na-eti na ngalaba nchekwa steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.