Ọrịa Ụkwaranta Na-Egbu Mmadụ 18 Kwà Awa Ọbụla Na Nigeria —WHO

Apr 17, 2021 - 07:58
 0
Ọrịa Ụkwaranta Na-Egbu Mmadụ 18 Kwà Awa Ọbụla Na Nigeria —WHO

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị Igbo na-ekwu sị onye e jiri ụkwaranta kwàá iyi kwàkwụrụ, maka na ụkwaranta anaghị egbu na ntà.

Ka ọ dị taa, Nigeria enwetela nturuugo dịka obodo ọrịa ụkwaranta bụ 'Tuberculosis' (TB) kacha akpa ike ma na-egbu ndị mmadụ gwòògwòò na mba Afrika niile, nà ebe nke isii ya bụ ajọ ọrịa kachakwa egbu mmadụ na mba ụwa niile gbaa gburugburu.

Nke a bụ nke a gbara n'anwụ site na nchọcha ụlọ ahụike mba ụwa, bụ 'World Health Organisatio (WHO)' mere na nsonso a, bụkwa nke mpụtara ya gosiri ọnọdụ ala Nigeria n'ọnụọgụgụ mba iri atọ ebe ọrịa ụkwaranta kacha akpa ike na mba ụwa. 

Dịka mpụtara nchọcha ahụ siri kọwaa, opekatampe, ọrịa ụkwaranta na-egbu mmadụ iri na asatọ (18) kwà áwà ọbụla na Nigeria, ebe mmadụ iri anọ na asaa (47) nà-ebute ọrịa ụkwaranta kwà áwà ọbụla na Nigeria, nke mmadụ asaa (7) n'ime ha bụ ụmụaka.

Ọ bụrụ na a gbakọọ ya nke ọma, ihe nke ahụ pụtara bụ na ọrịa ụkwaranta na-egbu mmadụ narị anọ na iri atọ na abụọ (432) na Nigeria kwà ụbọchị, ma na-egbu mmadụ otu narị puku na iri isii kwà ahọ ọbụla n'ala Nigeria, ebe mmadụ narị puku anọ na iri na otu na narị asaa na iri abụọ (411​720) na-ebute/enwete ya bụ ajọ ọrịa na Nigeria.

Ụfọdụ ndị ọkachamara na ngalaba ahụike, nke gụnyere Dọkịta Tito Aiyenigba, Dọkịta Itohowo Uko, Dọkịta Raphael Onyilo, Dọkịta Adebare Jumoke, na Dọkịta Eze Ogale bụ ha kwuru banyere mpụtàrà ahụ na nsonso a n'otu ọgbakọ nkụzi a chịkọbaara ndị nta akụkọ na steeti Ekiti na Ondo na nsonso a, site n'aka 'National Tuberculosis and Leprosy Control Program' na njikọaka 'Breakthrough Action'.

N'okwu ha n'ọgbakọ nkụzi ahụ nke isiokwu ya bụ (ma a sụgharịa ya n'Igbo) "Ọnọdụ Ụkwaranta n'Ala Nigeria: Ihe O Jiri Dị Mkpa Ka Ndị Nta Akụkọ Kwuo Maka Ya", ndị ọkachamara ahụ mere ka a mara mkpa ọ dị na e welitekwuru aka n'ịchọpụta ọrịa ụkwaranta n'oge, ikwupụta banyere ya na igwọ ya n'oge na Nigeria.

Ha kọwapụtagasịrị ụzọ dị iche iche mmadụ pụrụ isi bute ọrịa ụkwaranta, etu e si achọpụta ya, nakwa usoro a pụrụ isi wee gwọọ maọbụ gbochie ikesà ya, ma kpọkuzie ndị ntaakụkọ na ụmụafọ Nigeria ka ha sonye n'agha ahụ a na-ebu megide ọrịa ụkwaranta site n'ikwu/ịkọwa maka ya, na inye onye butere ya ọgwụgwọ n'oge, nakwa igbochi nkesa ya kpamkpam, maka na mgbochi ọrịa ka ọgwụgwọ ya mma.

Dịka ha na-akọwa banyere ya bụ ọrịa nà ụdị ya, ndị ọkachamara ahụ mèkwazịrị ka a mara na ọrịa ụkwaranta dịkwà iche n'ọrịa korona, n'agbanyeghị na ha nwere ụfọdụ njirimara yiri onwe ha, dịka ụkwara, ọkachasị ụkwara kpọnkụ. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484