Oriakụ Soludo Ekwela Nkwà Itinye Anya Nke Ọma n'Ihe Metụtara Ụmụnwaanyị na Ụmụaka

Nov 21, 2021 - 16:05
 0
Oriakụ Soludo Ekwela Nkwà Itinye Anya Nke Ọma n'Ihe Metụtara Ụmụnwaanyị na Ụmụaka
: :
playing

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị a ọ na-adị mma ịkwado ụlọ n'oge tupuu oge ụra eruo 

Ka ọ dị taa, Oriakụ Nonye Soludo, bụ nwunye Ọkammụta Chukwuma Soludo, onye ahụ a họpụtara ọhụrụ ịbụ gọvanọ steeti Anambra emeela ka a mara na ihe metụtara ọdịmma ụmụnwaanyị na ụmụaka so n'isi sekpụ ntị n'ihe ọ ga-elebàkarị anya ma ọ bụrụ na di ya banye n'ọkwa kpọmkwem dịka gọvanọ steeti ahụ.

Oriakụ Soludo kwupụtara nke a n'okwu ya n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, bụkwa ebe ọ nọrọ wee kwuo na ụmụnwaanyị bụ ndị kachasị n'ọnụọgụgụ, bụrụkwa ndị na-atụnye ụtụ nke ukwuu n'ịkwàlìtè mmepe obodo, kọwakwa ụmụaka dịka ọdịnihu nke steeti ahụ.

O mere ka a mara na ọ bụ eziokwu na di ya enweela ma hazie atụmatụ ihe ọ ga-emegasịrị ụmụnwaanyị ma ọ banye n'ọkwa, mana ya onwe ya ga-agbàkwụnyekwu ihe na ya site n'ịtụpụtasịkwa atụmatụ nke ya na ebumnobi ya banyere ụmụnwaanyị na ụmụaka steeti ahụ.
Ya bụ agụ nwaanyị gosipụtakwara ezi mmasị o nwere n'ihe gbasaara adịmọcha na ezi ọnọdụ ahụik, ma kwe nkwà na ọ ga-agbasikwa mbọ ike ịkwàlite ezi ọnọdụ adịmọcha na ahụike, buo agha megide ihe dị icheiche na-ewèta ọnwụ nne na ọnwụ nwa na mpahara ebe dị ichiche na steeti ahụ.

O kelere nwunye Gọvanọ Willie Obianọ, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ nà òtù ọrụ obiebere ya bụ 'Caring Family Enhancement Initiative, CAFE' maka itute olileanya ọtụtụ ndị mmadụ na steeti ahụ; ma kwe nkwa na ọ ga-agbasokwa usoro na atụmatụ ahụ, iji gaa n'ihu n'itute olileanya ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị n'ime-ime obodo dị icheiche, ka ikuke ezi ọchịchị gọọmenti wee kùsa ha.

Ọ rịọkwazịrị ọhaneze Ndị Anambra, ọkachasị ụmụnwaanyị ka ha dọnyere ya ukwu ma nyekwa ya nkwàdo kwesiri ekwesi, ma mekwa ka a mara na ha dị njikere ịnabàtà ọmarịcha atụmatụ ọbụla mmadụ jiri bịa, iji nyere ya aka imezùpùtè ezi ebumnobi o nwere maka ụmụnwaanyị na ụmụaka, na iji bulikwa steeti ahụ n'ogoogo dị elu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484