Ọrụ Amalitela n'Okporo Ụzọ Enugwu-Ukwu -Nise—Nibo—Agu Awka

Aug 13, 2020 - 20:56
Jan 28, 2021 - 20:56
 0
Ọrụ Amalitela n'Okporo Ụzọ Enugwu-Ukwu -Nise—Nibo—Agu Awka

By Izunna Okafor

N'imezupụta ezi ebumnobi ya ịhụ na e nwere ezi okpuru ụzọ na gburugburu niile nke steeti ahụ, gọọmenti steeti Anambra amalitela ọrụ idozigharị okporo ụzọ ahụ siri Enugwu-Ukwu wee gaa Nise, gaa Nibo, wee pụta Agụ Awka.

Ya bụ ọrụ ndozigharị okporo ụzọ bụ nke Gọvanọ Willie Obianọ bagidere na ya na nsonso a, ma bụrụkwa nke Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ Marcel Ifejiofor gara leta ka ọrụ si aga na ya na nsonso a. 

N'okwu ya oge o letachara ka ọrụ si aga n'ebe ahụ, Kọmishọna Ifejiọfọr gosipụtara afọ ojuju ya banyere etu ihe si aga nakwa ogoogo e ji arụ ya bụ ọrụ. O kwupụtakwara obi ụtọ ya banyere etu ụlọọrụ ji ọrụ si arụ ọrụ ma n'ụbọchị ụka, iji hụ na a rụpụtara ọtụtụ ebe, ọkachasị ugbu a anwụ ka na-acha, tupuu mmiri amalitekwa izò nnukwu ọzọ.

O mere ka a mara na e teela ụfọdụ mpaghara ụzọ ahụ malite n'Enugwu-Ukwu ruo na Nise, ma sịkwa na gọọmenti kpachara anya wee tinye uchu na mpaghara ahụ, n'ihi na ebe ahụ emebiela nke ukwuu ma dịkwa njọ nke ukwuu. O nyekwazịrị ndị na-agba n'ụzọ ahụ ndụmọdụ ka ha wetuo obi ma nwekwa ndìdì dịka ọrụ ka na-aga n'ihu n'ebe ahụ, n'ihi na ọrụ ga-akụrụ ọnụ n'ebe ahụ n'oge adịghị anya.

O nyekwazịrị owuweanya na gọọmenti steeti ahụ agaghị ada mbà n'ịgbata ọsọ enyemaka n'ebe ọbụla okporo ụzọ nwere nsogbu na mpaghara niile nke steeti ahụ, ọ kachasị n'ebe dịkarịchara njọ. O kwere nkwa na gọọmenti ga-agbatakwa ọsọ ma lebàkwa anya n'ebe ndị ọzọ e nwere ajọ ọnọdụ okporo ụzọ dị etu ahụ na mpaghara steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.