Òtù 'All4One' Akwụọrọla Mmadụ 14 Ụgwọ Ụlọọgwụ Na Nnewi

Òtù 'All4One' Akwụọrọla Mmadụ 14 Ụgwọ Ụlọọgwụ Na Nnewi

Jan 14, 2021 - 00:08
Jan 19, 2021 - 18:10
 0
Òtù 'All4One' Akwụọrọla Mmadụ 14 Ụgwọ Ụlọọgwụ Na Nnewi

By Izunna Okafor

Òtù ọrụ obi ebere a maara dịka 'All4One Friends Club of Nigeria' nọrọ na nsonso a wee kwụọrọ mmadụ iri na anọ ụgwọ ụlọọgwụ n'ụlọ ahụike nkụzi Mahadum Nnamdị Azikiwe dị na Nnewi, n'okpuru ọchịchị 'Nnewi North' nke steeti Anambra.

Ya bụ òtù, nke ebumnobi ya bụ ịkwalite ọdịmma ndị òtù ya, ịkwalite mmụọ ịdị n'ótù n'etiti ndị òtù ahụ nakwa òtù ndị ọzọ, na inyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka, kwụụrụ ndị ahụ ụgwọ ụlọọgwụ ahụ dịka ótù n'ime ụzọ ndị ọzọ pụrụ iche ha siri chịkọta ahọ gara aga bụ ahọ 2020, wee nabatakwa ahọ ọhụụ, bụ ahọ 2021.

N'okwu ya oge ha gara ịkwụ ya bụ ụgwọ ụlọọgwụ, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Maazị Ifeanyi Epundu kọwara ụgwọ ahụ ha kwụụrụ ndị ahụ ahụ adịghị dịka otu n'ime ụzọ dị iche iche ha si enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka, ọkachasị ndị ọrịa nọ n'ụlọọgwụ na ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ dị iche iche.

Dịka ọ na-ekwu na nke ahụ ga-enye aka ime ka ihu ọchị waa ndị ahụ soro rite úrù na ya n'ime ahọ ọhụụ a, Maazị Epundu gara n'ihu gwa ndị ahụ nakwa ndị ọzọ nọ n'ọnọdụ mkpa maọbụ ihe isi ike dị iche iche ka ha mara na ọnọdụ ahụ abụghị njedobe ndụ ha, ma chetekwara ha na onye ọbụla dị ndụ nwere olileanya.

N'okwu nke ya nye ndị òtù ahụ, onyeisi nhazi n'ụlọ ahụike ahụ, bụ Ọkammụta Anthony Igwegbe kèlèrè ndị òtù ahụ maka ọmarịcha ọrụ obi ebere ahụ ha rụrụ, ma kpọkuo òtù ndị ọzọ dị iche iche nakwa ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ, ka ha ñomie nke ahụ site n'inyerịtara ndị ihe na-esiri ike nọ na gburugburu ha aka.

Ndị ahụ a kwụụrụ ụgwọ ụlọọgwụ gụnyere ụmụnwaanyị mụrụ ụmụ ọhụụ, onye nwetara mmerụahụ site n'ihe mberede okporo ụzọ, nwoke gbajiri ọkpụkpọ nkwonkwo bụ spaịnaa kọọdụ ya, tinyekwara ndị ọzọ dịchagoro mma mana ha apụghị ịkwụnwu ụgwọ ụlọọgwụ ha, n'agbata ọnwa Julaị ahọ gara aga ruo ọnwa ekeresimeesi.

Ha niile, bụ ndị ọnụ jupụtara obi, jiri ọbi ụtọ wee kelee ndị otu ahụ, ma kpee ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ha na ime ka ihe ọma ghara ịkọ ụkọ n'ime ndụ ha, n'ihi ezi ọrụ obi ebere ahụ ha rụrụ, bụ nke mere ka ha jiri ihu ọchị na egwu ọñụ wee bata n'ime ahọ ọhụụ 2021.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.