Otu Egwu Bọọlụ Ala Anyị Akwadowela

Mar 20, 2019 - 20:20
Jan 22, 2021 - 06:24
 0
Otu Egwu Bọọlụ Ala Anyị Akwadowela

Ibe Kelechukwu, Ogun State, Nigeria

Otú egwu bọọlụ ala anyị, Super Eagles, ebidola nkwadebe n'ebe ọ kpụ ọkụ n'ọnụ maka asọmpi itozuoke iji were sonye n'iko mba Afrịka nke afọ puku abụọ na iri na iteghete n'ụbọchị Fraịdee megide ndị òtù ha bụ ndị mba Seychelles na ama egwuregwu Stephen Keshi, dị na Asaba dịka ndị egwu bọọlụ mmadụ iri abụọ na atọ sonyere na ya bụ nkwado nke onye nọ n'isi ya bụ Gernot Rohr.

Mmadụ ise: Francis Uzoho, Henry Onyekuru, John Ọgụ, Oghenakaro Etebo na Victor Osimhen, bụ ndị a na-eche na ha ga-erute na ebe nchere oge ha na elekere anọ nke mgbede ụbọchị Tuzdee, mana otu na-ahụ maka egwu bọọlụ ala anyị bụ "Nigeria Football Federation" ekwetala na ndị ahụ na-agba bọọlụ na mba ofesi erutela site na Twitter na mgbede ụbọchị ahụ.

"Ụlọ zuru ezu. John Ogu, Etebo Oghenakaro, Francis Uzoho, Victor Osimhen na Henry Onyekuru awụchiela na-ebe nchere iji sonyere na nkwadebe nke taa. #FeeSuperEagles #Team9jaStrong." bụ ihe ha dere na Twitter nke otu egwu bọọlụ

Nanị mmadụ asaa n'ime ndị otu egwu bọọlụ ahụ bụ ndị rutere maka nkwadebe ahụ na Mondee, nke gụnyere Alex Iwobi, Odion Ighalo, Semi Ajayi, Valentine Ozornwafor, Daniel Akpeyi, Ikechukwu Ezenwa na Ikouwen Udo, bụ ndị rutere n'oge.

Ọnụ ọgụgụ ha bawanyere ụba na Tuzdee dịka osote onye isi otu egwu bọọlụ ahụ bụ Ahmed Musa, Leon Balogun, Kenneth Omeruo, William Troost-Ekong na ndị ọzọ sonyere ibe ha na ebe nchere ahụ.

Ndị egwu bọọlụ ahụ nwere nkwadebe mbụ ha maka asọmpi ahụ oge ọ fọdụrụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere ise nke mgbede ụbọchị Tuzdee n'ámá egwuregwu Stephen Keshi.

Ndị otú egwu bọọlụ Gernot Rohr bụ ndị tozugororị maka asọmpi iko mba Afrịka nke afọ puku abụọ na iri na iteghete na ndị ọgbọ ha na mba Ijipt ga-asọkwa mpi nke enyi na enyi na Asaba ụbọchị Tuzdee izu ụka ọzọ.

N'akụkụ nke ọzọ, otú egwu bọọlụ mba Seychelles, a na-akpọ 'Pirates', wụchiri na Abuja na Tuzdee maka asọmpi itozu oké iko mba Afrịka.

Mmadụ dị iri abụọ na iteghete nke si mba Seychelles bịa, soro ụgbọ elu Ethiopia were bata n'ehihie Tuzdee ma bụrụzie ndị ga-agaba Asaba na Wednezdee (taa), dịka akụkọ sị na ụlọ ọrụ ndị NFF sịrị dị

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.