Òtù Emeka Ọffọr Ebunyela Ụlọ Ahụ Ike Mahadum COOU Ngwaọrụ n'Efù

Mar 25, 2020 - 22:10
Jan 22, 2021 - 21:46
 0
Òtù Emeka Ọffọr Ebunyela Ụlọ Ahụ Ike Mahadum COOU Ngwaọrụ n'Efù

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na ọ bụ nke onye mere n'uje ka e ji ekwupùru ya n'ụla. Ka ọ dị taa, òtù ọrụ obi ebere a mààrà dịka 'Sir Emeka Ọffọr Foundation' ebunyela ụlọ ahụ ike mahadum 'Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu' imirikiti akụrụngwa na ngwaọrụ ahụ ike gburu nde kwùru nde Naịra n'efù, iji kwàlite ọrụ ya bụ ụlọ ahụ ike.

Mmemme inyefe ngwa ọrụ ahụ ike ahụ n'aka ya bụ ụlọ ahụ ike mahadum bụ nke weere ọnọdụ n'ogige isi ụlọọrụ ahụ dị n'Amakụ, Awka.

N'okwu ya oge ọ na-enyefe nke ahụ n'aka ya bụ ụlọ ahụ ike, onyeisi ndị ọrụ n'òtù 'Sir Emeka Ọffọr Foundation' bụ Maazị Chris Ezike kwùrù na nke ahụ bụ iji mezùpụta nkwà onyeisi òtù ahụ, bụ Maazị Emeka Ọffọr kwèrè ya bụ ụlọ ahụ ike n'oge gara aga.

O mere ka a mara na nke ahụ so n'otu ụzọ pụtara ìhè òtù ahụ si atụnye ụtụ nke ya n'ịkwàlite ezi ọnọdụ ahụ ike, kwuo na ya bụ akụrụngwa ga-enye aka n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche n'ịkwalite usoro ọrụ ahụike na ya bụ ụlọ ọgwụ, ma dụkwazie ndị isi ya bụ ụlọ ọrụ ahụike ka ha lekọta, chekwaba, ma tinyekwa akụrụngwa ahụ n'ọrụ otu o siri kwesi.

Na nzaghachi oge ọ na-anabata akụrụngwa ahụ n'aha isi ọchịchị ụlọ ahụ ike ahụ, onye ji ọkwa 'Chief Medical Director' nke ya bụ ụlọ ahụ ike, bụ Dọkịta Basil Nwankwọ fọrọ èkele n'ụkpa, wee bunye ya bụ òtù maka onyinye afọ òfùfò ya, ya na imezupụta nkwà ha kwèrè ya bụ ụlọọrụ.

Ka ọ na-ekpe ka Chineke kwụghachi ya bụ òtù na onyeisi ya mmaji kwùrù mmaji, Maazị Nwankwọ kwekwazịrị nkwa na ha ga-etinye akụrụngwa ahụ n'ọrụ etu o siri kwesi ma werekwa ya mepụta ihe a tụrụ anya.

Òtù 'Sir Emeka Ọffọr Foundation' bụ òtù nnọrọ onwe na-abagide n'ọrụ obi ebere, inyerịtara ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka, ịkwalite mmụta na ahụike, ya na inye nkwàdo n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.