Òtù Jessybela Enyela Ụmụnwaanyị Ajadu Nkwàdo n'Ụmụeri

Apr 9, 2021 - 17:05
 0
Òtù Jessybela Enyela Ụmụnwaanyị Ajadu Nkwàdo n'Ụmụeri

Izunna Okafor

Onye na-etinye ọchị n'ihu nwaogbenye na-etinye ọchị n'ihu chi kere nwaogbenye.

N'ịgbaso nke a, òtù ọrụ obiebere a mara dịka 'Jessybela Foundation' nọrọ na nsonso a wee kersàára ụmụnwaanyị ajadụ ruru narị abụọ n'ọnụọgụgụ ihe nkwàdo n'Ụmụeri, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East', na steeti Anambra.

Mmemme ikesà ihe ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ogige ezumeezu Ụmụeri, bụ Ụmụeri 'Civic Centre' ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kesàárá ụmụnwaanyị ahụ ego, igbe erimeri, ákwà na ihe ndị ọzọ site n'aka òtù ọrụ obiebere ahụ, bụ ndị nọrọ na mbụ wee ga kpọtụrụ eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Ben Emeka.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onye chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi òtù ahụ, bụ Nwaada Jessica Nweke mere ka a mara na ọ bagidere n'atụmatụ ikesa ihe ahụ dịka otu n'ime ụzọ ya na òtù ya si atụnye ụtụ n'ịkwalite ọdịmma obodo na ime ka ihu ọchị waa ndị ọnọdụ dịịrị añaa, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ kwàlite ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ.

O mere ka a mara na ọ bụ site na njikọaka nà ntụnye dị etu ahụ ka a pụrụ isi mee ka obodo na ọnọdm obibindụ kawanye mma, n'ihi na ihe niile ekwesighị ka a hapụrụ ya naanị gọọmentị, maka na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja.

Nwaada Nweke, onye bụkwa nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n'ihe gbasaara gburugburu gàkwàrà n'ihu mee ka a mara na atụmatụ òtù ahụ na-elekwasịkarị anya n'ebe o metụtara ndị ụwa na-atụ n'ọnụ, ndị nwere mkpa pụrụ iche, na mmepe obodo n'izugbe. 

Ọ kpọkukwazịrị ndị ọzọ ọnọdụ dịtụụrụ mma ka ha na-echeta, na-akwàdo, ma na-etinye ọchị n'ihu ndị ụwa na-atụ n'ọnụ, maka na gọọmentị apụghịkwanụ imecha ihe niile n'otu oge.

Na ntụnye nke ya, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe metụtara nkwàdo ndị ntorobịa, bụ Nwaada Ngozi Nnamekwe kèlèrè Nwaada Nweke maka ọmarịcha atụmatụ dị etu ahụ, ma kelekwazie eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Ben Emeka, onye ọ kọwara dịka di ndị enweghị di n'obodo ahụ, n'ihi ezi ọmarịcha ọrụ dị etu ahụ ọ na-arụ, nakwa etu o si akwàlite mmepe obodo ahụ n'ụzọ pụrụ iche.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ n'ime ụmụnwaanyị ahụ soro keta òkè na nkwàdo ahụ ụbọchị ahụ, kèlèrè ya bụ Nwaada Jessica, onye ụbọchị ahụ bụkwa ụbọchị ncheta ọmụmụ ya nà ọgbụgbà ahọ iri atọ ya. Ha kpekwazịrị ka Chineke gaa n'ihu ịgọzị ya, iji ogologo ndụ na ahụike wee chọọ ya mma, nakwa ibuli ya n'ogoogo dị elu oge niile n'ihi ihe ahụ o mere.

Ikesàrà ụmụnwaanyị ahụ ihe nkwàdo ahụ na ịgba egwu site naka ụmụnwaanyị ahụ so n'ihe pụrakarịchara ìhè na mmemme ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484