Otu jikọrọ ụmụ afọ Igbo ndị ọrụ bekee akpọkuole mba ụwa maka mmegbu ndị Igbo n’ala Naịjirịa

May 24, 2021 - 20:02
May 30, 2021 - 18:45
 0

Ọkụkọ egbe buru nwa ya ka ndị ụwa na-ajụ sị «Kedu ihe Ị na-etiri mkpu?». Ọ zara ndị ụwa sị ha na ịhe ya na-etiri mkpu bụ ka ụwa mara ihe ya na ije na-eje.

Otu n’ime otu nzụkọ ụmụ afọ Igbo ndị na-arụ ọrụ bekee n’ala Naịjirịa akpụkuola mba ụwa ka ha leba anya n’oku ahụ nwoke onye awụsa, onye isi ndị uwe ojii na Naịjirịa, bụ Usman Alkali Baba, kpọrọ na nso nso a. 

N’izu ụka gara aga, Usman Baba gwara ndị nchekwa Naịjirịa ahụ a na-ezidata n’ala Igbo sị ha were egbe gbabuo onye ọbụna ha hụrụ n’ala Igbo.

Ndị otu ahụ, bụ ndị na-aza Nzukọ Ụmụnna, ekwuona n’ọ bụ ihe jọgburu udele n’ala Naịjirịa na-eziga ndị uwe ojii na ndị soja n’ala Igbo. Ọ bụkwa ịhe sigburu nkakwụ na onye isi ndị uwe ojii bụ Usman Baba nyekwere ndị ọrụ nchekwa ahụ iwu ma kwadoo ha si ha gbagbuo onye ọbụna ha huru n’ụzọ.

Mgbe ndị otu ahụ na-agwa ndị nta akụkọ okwu n’Abuja n’ụbọchị Mọnde, ha kwuru na Usman Baba kpọrọ oku ahụ si ndị ọrụ nchekwa ala Naịjirịa gbagbuo onye ọbụna ha hụrụ n’ala Igbo mgbe yabụ Usman Baba na-ekwu okwu n’Enugu, n’abalị 18 nke ọnwa Mee, mgbe ọ na-awube atụmatụ nchekwa ọhụrụ, nke ọ kpọrọ Operation Restore Peace in the Southeast n’asụsụ bekee.

Ndị otu ahụ kpọkuru Usman Baba ka ọ bụchapụ asọ mmiri, sachaa ọnụ ya, ma gwaka ndị ala Naịjirịa na ya kwuhiere ọnụ. Emeghị nke a ga-eme ka ndị nchekwa ala Naịjirịa megide ndị Igbo n’ụdị dị ịche ịche dịka ha megoro na mbụ.

Nzụkọ Ụmụnna ahụ kpọkuru ndị National Human Rights Commission ka ha lebaa anya n’okwu ahụ Usman Baba gwara ndị ọrụ nchekwa n’ihi na nke ahụ ezighị ezi n’usoro ikpe nkwụmọtọ, ma ọ bụ usoro obibi ndụ onye emegbuna ibe ya.

Kemgbe Usman Baba kwuru okwu a, ọtụtụ ndị Igbo na-atụ ụjọ na ha amaghị mgbe ndị soja Naịjirịa ga-amalite gbagbuwe ndị Igbo dịka ha megoro na mbụ, n’ebe dị ịche ịche. Ebe ndị gunyere Umuahia na Orlu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.