Otu Jikọtara Ndị Gọvanọ Ndịda-Ọwụwa Anyanwụ Emeela Ọgbakọ Mbụ n'Ahọ 2020

Feb 13, 2020 - 01:24
Jan 24, 2021 - 01:17
 0
Otu Jikọtara Ndị Gọvanọ Ndịda-Ọwụwa Anyanwụ Emeela Ọgbakọ Mbụ n'Ahọ 2020

Izunna Okafor, Awka

Buusu sị na ọ bụ mmekọrịta ahụ bụ ụtọ nwanne, maka na ọ na-abụ e zùó n'ìzù, gbaa afa, a gbata obì ndị mmụọ. N'ịgbasò nke a, òtù jíkọtára ndị Gọvanọ ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị, a mààrà na bekee dịka "South-East Governors Forum" enweela ọgbakọ nke mbụ na mbụ ha n'ime ahọ 2020, bụ ebe ha nọrọ wee tụkọọ arò ọnụ dịka ụmụnne, ma tinyekwa ọnụ n'okwu bànyere ihe dị iche iche na-eme na mpaghara ahụ.

Ya bụ ọgbakọ, bụ nke weere ọnọdụ na steeti Enugu dọtàrà Gọvanọ Steeti Ebonyi, bụkwa onyeisioche òtù ahụ, Gọvanọ David Ụmahị; Gọvanọ Ifeanyị Ugwuanyị nke Steeti Enugu; Gọvanọ Okezie Ikpeazụ nke Steeti Abịa; na osotè Gọvanọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okeke, bụ onye nọchitere anya Gọvanọ Willie Obianọ.

N'okwu ya n'ọgbakọ ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Obianọ, nke ọ bụ osòte ya bụ Dọkịta Nkem Okeke nọchitere anya ya, kọwàpụtààrà ndị otu ahụ ka eke si anya anwụ n'ọrụ àkwà ohimiri Niger nke abụọ (bụ Second Niger Bridge), ma gosikwa ha eserese dị iche iche bàyere otu ya bụ ọrụ si agan nakwa ogoogo ọ nọ na ya ugbua.

N'akụkụ nke ya, aka na-achị Steeti Enugu, bụ Gọvanọ Ifeanyị Ugwuanyị mekwààrà ka ndị òtù ahụ mara ka ọrụ si aga n'ike n'ike n'idozigharị ọdụ ụgbọelu mba ụwa Akanụ Ịbịam dị n'Enugu, bụkwa nke onye na-ahụ gbàsaara ọrụ n'òtù ahụ, bụ Injinia Chris Okoye tìnyèrè ọnụ na ya, wee kwuo hoohaa na ya bụ ọrụ na-agawanye n'ihu nakwa n'ogoogo dị elu.

N'okwu dịkwa ka ibè ya, Gọvanọ Ikpeazụ nke Steeti Abịa kọwapụtàrà ka agadi si asụ ụtàrà ji n'ọrụ idozigharị okporoụzọ àwàrá àwàrà ahụ siri Enugu gaa Porthacourt, bụ nke ọ kọwàra na ọ na-aga n'ihu, na-agbanyèghị na ọ na-akpụ ka ejula, n'ihi na gọọmenti etiti anaghị enyecha ya bụ ụlọ ọrụ mba China ji ọrụ ngo ahụ ego otu o kwèsìrì iji rụchapụ ya bụ ọrụ tupuu udummiri.

N'ịgbàkwụnyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ndị otu ahụ lebàrà anya na ya; ha nọkwàrà n'ọgbakọ ahụ wee nyekwuo nkọwa ma metụ okwu ọnụ bànyere atụmatụ nchekwa mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, bụ 'South East Joint Security' bụkwa nke e guzobèrè n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Julaị ahọ 2019 ma guzobekwa òtù ọrụ ga ahụ màkà ya na itinye ya n'ọrụ, bụ 'South East Joint Security Committee' n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa Ọgọọstụ ahọ ahụ.

N'ozi ọ gụpụtaara ndị nta akụkọ bànyere ọgbakọ ahụ na nkwekọrịta ndị otu ahụ oge ya bụ ọgbakọ bịara n'isi njedobe, onyeisi oche òtù ahụ, bụ Gọvanọ Dave Ụmahị kwùrù na ha na-ekele gọọmenti etiti na onyeisi ala Muhammadụ Buharị maka ọrụ ahụ na-aga n'ihu n'ebe dị iche iche na mpaghara ahụ.
Dịka mkpesa ha nwètàrà siri dị, o kwupụtàrà owùwè anya ndị òtù ahụ, na a ga-emepegharị ya bụ ọdụ ụgbọelu mba ụwa Akanụ Ịbịam a na-edozigharị n'Enugu n'abalị iri na atọ nke ọnwa Maachị ahọ a, dịka e siri kwuo na mbụ.

O kwukwàrà na mkpesa ha nwètarà bànyere àkwà ohimiri Niger nke abụọ na-egosi na ya bụ ọrụ nwèrè ike ịkụrụ ọnụ tupuu ọchịchị onyeisiala Buharị abịa na njedobe, ọbụnadị dịka ọ kpọkùzịrị gọọmenti etiti ka ọ na-etinye ego otu o siri kwesi n'ọrụ idozigharị okporoụzọ àwàrá àwàrà ahụ siri Enugu gaa Porthacourt, iji ha na a rụchapụrụ ya tupuu udummiri awụchie, ọ kachasị mpaghara ebe ahụ siri Abịa gaa Porthacourt, bụ nke e kwuru na o dèbèrè ime na ọnụ ka ntọọ ugbua.

Ka ọ na-ekele ndị òtù Ọhaneze Ndị Igbo maka ịbịa nọnyere ha n'ọgbakọ ahụ, Gọvanọ Ụmahị kwupụtàzịkwàrà mkpebi ndị òtù ahụ ịkwàlite ọnọdụ akụnaụba, ọnọdụ obibi ndụ, ọnọdụ nchekwa na ezi ọnọdụ mmepe mpaghara ahụ n'izugbe site n'usòro ezi ọchịchị ha, mmekọrịta na ijikọaka ọnụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.