Òtù Marcel Ofomata Enyela Ọtụtụ Ndị Mmadụ Ọgwụgwọ n'Efù

Aug 19, 2020 - 20:58
Jan 28, 2021 - 20:59
 0
Òtù Marcel Ofomata Enyela Ọtụtụ Ndị Mmadụ Ọgwụgwọ n'Efù

Izunna Okafor

Na ntụnye ya n'ịkwàlite ezi ọnọdụ obibi ndụ na ọnọdụ ahụike ụmụ mmadụ, òtù a maara dịka 'Marcel Ofomata Foundation' nọrọ na nsonso a wee nye mmadụ karịrị narị abụọ n'ọnụọgụgụ ọgwụgwọ n'efù.

Atụmatụ inyòcha ahụ na inye ọgwụgwọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ogige ụlọ ahụike 'Agulu Primary Health Centre' dị n'Agụlụ, n'okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha, ma bụrụkwa nke ndị mmadụ nupụtàrà n'ìgwè wee sonye na ya.

A nọkwara na ya bụ mmemme wee nye ọtụtụ ndị mmadụ ọgwụgwọ dịka ọrịa dị iche iche ha burù bịa siri dị, nke gụnyere ọrịa ọbara mgbalielu, ụdị ịbà dị iche iche, anya mgbu, ahụ ọkụ, isi ọwụwa, na ọrịa ndị ọzọ.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, onye hibere òtù ahụ, bụ Dọkịta Marcel Ofomata mere ka a mara na atụmatụ ahụ na ọgwụgwọ ahụ ọ na-achịkọba na mgbe na mgbe bụ ihe ọ na-emere onwe ya iji nyere ụmụ mmadụ aka kwalite ọnọdụ ahụ ike ha, ma bụrụkwa nke o nweghị ihe ọbụla jikọọrọ ya na ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ kọwara na ya malitere ime nke ahụ kemgbe ahọ asatọ gara aga, ma kwukwa na e wezùga atụmatụ ahụike ahụ, na òtù ahụ nwere ihe ndị ọzọ dị iche iche ọ na-abàgide maọbụ na-achịkọba, iji nyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka ma kwalitekwa ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ. Ihe ndị ahụ, dịka o siri kọwaa, gụnyèrè ịkwàdo ụmụ na-eto eto, inye ohere agụmakwụkwọ n'efù, ịchịkọba ọzụzụ n'ụdị na ngalaba dị iche iche, ịkwalite omenala, ịkwàdò ọmụmụ ọrụaka, ịgbazinye ego, ịkwalite egwuregwu, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

N'okwu ha n'otù n'ótù, ụfọdụ ndị soro rite úrù n'atụmatụ ahụike ahụ ụbọchị ahụ a chịkọbàrà ụbọchị ahụ, nke gụnyere Maazị Ignatius Ekwo na Oriakụ Grace Ohanu kèlèrè Maazị Ofomata na òtù ya maka ezi atụmatụ ahụ nà ọrụ ọma ndị ọzọ ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ. Ha kpekwazịrị ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ya na òtù ya mmaji kwùrù mmaji, ọbụnadị dịka ha kpọkùrù ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ ka ha ñòmie ọmarịcha atụmatụ dị etu ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.