Òtù Nnakwe Ejirila Ígwè E Ji Akwa Akwà Wee Kwàdo Ụmụnwaanyị

May 6, 2021 - 20:29
 0
Òtù Nnakwe Ejirila Ígwè E Ji Akwa Akwà Wee Kwàdo Ụmụnwaanyị

Izunna Okafor dere akụkọ a

Oke ọñụ dara na nsonso a, dịka òtù ọrụ enyemaka a maara dịka 'Nnakwe Foundation' jiri ígwè e ji akwa ákwà wee kwàdó ọtụtụ ụmụnwaanyị dị iche iche n'Ifite-Anam, n'okpuru ọchịchị Anambra West, nke steeti Anambra.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onye nwe òtù ọrụ enyemaka ahụ, bụ Maazị Simeon Nnakwe, onye obodo Oroma-Etiti Anam dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Anambra West, mèrè ka a mara na ígwè ahụ bụ onyinye afọ òfùfò e nyere òtù ahụ site n'aka Maazị Osita Offozor, bụ onye obodo Umuikwu Anam, ma birikwa mba South Africa, ebe ọ nọ azụ ahịa.

Ọ gara n'ihu kwuo na ígwè ahụ e ji akwa akwa dị iri na asaa n'ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa nke ebumnobi e jiri kesàá ya bụ iji wee nye ụmụnwaanyị ahụ nkwàdo iji bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha; ọbụladị dịka o kelere ya bụ nwoke bunyere ha akụrụngwa ahụ, ma kpee ka Chineke kwụghachi ya mmaji kwuru mmaji.

Dịka ọ na-akpọku ndị ahụ ketara òkè n'akụrụngwa ahụ ka ha jiri ya bàára onwe ha uru ma jirikwa ya mepụta ihe a hụrụ anya, dịka a na-atụ anya n'aka ha; Maazị Nnakwe kwèrè nkwà na ọ gaghị ada mbà n'ọrụ obi ebere ya na inye ndị ụwa na-atụ n'ọnụ nkwàdo, n'ihi na nke ahụ so na mkpebi ya n'ịkwalite ọdịmma nke mmadụ na ọnọdụ obibindụ ọhaneze.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n'ihe gbasaara ọrụ ugbo, bụ Oriakụ Theresa Okoye kèlèrè mmadụ abụọ ahụ nyere nkwàdo ahụ maka ezi ọrụ ha, ma kpọkuo ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ ka ha ñomie ha, maka na ezi ọrụ dị etu ahụ na-adọta ngọzị Chineke.

O tinyekwara ọnụ wee dụọ ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha jisie ike tinye ihe ndị ahụ n'ọrụ dịka a tụrụ anya n'aka ha, iji wee jiri ya kwàdo onwe ha, karịa ire ya n'ahịa.

Na nzaghachi, ụfọdụ n'ime ndị soro wee rite urù n'ihe nkwàdo ahụ, nke gụnyere Oriakụ Ifeoma Ateli na Chioma Nnaemeka kwèrè nkwa na ha ga-eji ihe ahụ mezupụta ebumnobi e jiri bute ya, ma kpezie ka Chineke gọzie ma kwụghachi ndị ahụ nyere ha nkwado ahụ mmaji kwuru mmaji.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484