Òtù Nnọrọonwe 'Center For Change' Enyela Obianọ Nkwanye Ugwu Maka Ọrụ Nchekwa

Feb 19, 2020 - 20:45
Jan 24, 2021 - 00:59
 0
Òtù Nnọrọonwe 'Center For Change' Enyela Obianọ Nkwanye Ugwu Maka Ọrụ Nchekwa

Izunna Okafor, Awka

Ndị òtù nnọrọonwe a maara dịka 'Center For Change' anabatala ma guzobe aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ dịka nnukwu onye nnọchianya mgbanwè òtù ahụ n'ihe gbasaara nchekwa n'ala Nigeria, bụ nke nwa bekee kpọrọ "Change Ambassador On Security".

Nke a bụ nke e kwupụtàrà ma bụrụkwa nke e mèrè mmemme ya n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụkwa ebe ọtụtụ ndị isi ọchịchị steeti ahụ sonyèrè na ya.
N'okwu ya oge ọ na-ekwupụta nke ahụ, ma na-enyekwa Gọvanọ Obianọ onyinye nkwanye ugwu bànyere nke ahụ; onye duru ndị ahụ wee bịa, bụ Dọkịta Joe Okei Ọdụmakịn mèrè ka a mara na nke ahụ bụ nke mbụ na mbụ ha na-akwanyere gọọmenti nọ n'ọkwa ùgwù n'ala Nigeria, kemgbe ahọ 2003 e jiri guzobe òtù ahụ.

O kọwàrà na nhọrọ ahụ ha họọrọ Gọvanọ Obianọ maka ọkwa ahụ na nkwanye ugwu ahụ n'ime gọvanọ niile nọ n'ala Nigeria bụ n'ihi ezi ọrụ ya dị iche iche n'ịkwalite mmepe, ọnọdụ obibi ndụ, na ezi ọnọdụ ndị ọzọ na-enyé aka ime ka obodo magbuo onwe ya, ọ kachasị n'ebe o metụtara ngalaba nchekwa.

Na nzaghachi, Gọvanọ Obianọ kèlèrè ndị òtù ahụ maka ịhụta ya dịka onye tozùrù oke inweta ụdị nkwanye ùgwù na ọkwa ahụ dị oke elu, ya na ịgba akaebe ha bànyere ọrụ ọma dị iche iche ọchịchị ya rụgoro na ngalaba nchekwa.

O mere ka a mara na ọ na-abụ e tòó onye gburu ewu, ọ hụ ehi o gbuo, n'ihi na ụgwọ ọrụ ezi ọrụ bụ ọrụ ka elu; ma sịkwazie na ọ ga-aga n'ihu ịrụ ịrụsi ọrụ ike na ngalaba nchekwa, ya na imepụta ihe anya na-ahụ na ngalaba ezi ọchịchị n'izugbe.

Ihe pụtakatịchara ìhè na mmemme ahụ bụ inye inyefè Gọvanọ Obianọ onyinye nkwanye ùgwù ahụ kpọnkwem.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.