Òtù Nnọrọonwe Ekesàárala Ụmụakwụkwọ Unizik Erimeri

May 6, 2020 - 20:21
Jan 22, 2021 - 21:22
 0
Òtù Nnọrọonwe Ekesàárala Ụmụakwụkwọ Unizik Erimeri

Izunna Okafor, Awka

Ihu ọchị wàrà ụmụakwụkwọ mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka na nso nso a dịka òtù ọrụ obi ebere a maara dịka 'Chinedu Umeadi Foundation' kesààrà ha ihe erimeri sị iche iche, iji bèlatara ha agụụ. Ihe erimeri ahụ e kesààrà ndị ahụ gụnyere mba ji ruru narị anọ n'ọnụọgụgụ, igbe erimeri noduul karịrị narị anọ, mkpọ mmanụ nkwọchasị aka bụ 'hand sanitizer' ruru narị anọ, na àkpà nnu ruru iri, tinyere ihe ndị ọzọ.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, onye nnọchianya òtù ahụ na ya bụ mmemme, bụ Maazị Osoluchukwu Onwuadi, mèrè ka a mara na ụmụakwụkwọ ahụ bịara kpọtụrụ òtù ahụ maka enyemaka, ma sịkwazie na mgbata ọsọ enyemaka ahụ bụ ótù n'ime ụzọ òtù ahụ sigoro nyere ndị mmadụ aka, ọ kachasị n'ime oge a ihe na-esiri ụmụ mmadụ ike n'ihi mkpamkpa ọrịa nje korona na-akpa na mpaghara ebe dị iche iche.

Ọ kọwara na òtù nnọrọonwe ahụ na-akwàdo ma na-elebàkarị anya n'ihe metụtara agụmakwụkwọ, nkwàdo ndị ntorobịa, ahụ ike, na ịchụ ụbịam ọsọ ụkwụ erughị àlà.

Na ntụnye nke ya, nwanne onye nwe òtù ahụ, bụ Maazị Uchenna Umeadi, mere ka a mara na òtù ahụ adịla na mbụ kesàá ihe nkwàdo nye ndị obodo Abagana, tupu ụmụakwụkwọ ahụ wee bịa kpọkuo ha maka ịgbatara ha ọsọ enyemaka.

O nyekwazịrị ụmụakwụkwọ ahụ ndụmọdụ ka ha na-erube isi nye ntụziaka dị iche iche gọọmenti nyere, nke gụnyere ịkwọchasị aka ha mgbe niile, ikpùchì ihe n'imi, ibèlàtà ngagharị, ịnọpụga anọpụga n'ebe mmadụ ibe ha nọ, tinyere ihe ndị ọzọ dị etu ahụ, iji gbanahị ibute ọrịa nje korona.

Oge ọ na-ekele òtù ahụ maka mgbata ọsọ enyemaka ya nyegara ụmụakwụkwọ ahụ, onyeisi otu jikọtara ụmụakwụkwọ (SUG) na mahadum Unizik, bụ Maazị Samuel Jude kpèrè ka Chineke gọzie ma kwụghaghị ya bụ nwa amadi nwe òtù ahụ mmaji kwuru mmaji maka afọma ya, ọbụnadị dịka o kwèrè nkwa na a ga-ekesà ihe ahụ etu o kwèsìrì, mekwa ka o ruo ndị e mebeere ya aka.

Òtù 'Chinedu Umeadi Foundation' bụ òtù enyemaka e hibere site n'aka Maazị Chinedu Umeadi, bụ nwaafọ Abagana dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Njikọka nke steeti Anambra, ma birikwa na mba Canada.

Òtù ahụ nọkwara na mmemme ahụ ụbọchị ahụ wee nye isi ọchịchị òtù ahụ jikọtara ụmụakwụkwọ mahadum ahụ, bụ SUG onyinye ego, iji kpọnyekwuo aka n'ihe erimeri ahụ e kesààrà ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.