Otu Nwoke Ebewaala Nwunye Ya Dị Ime Afọ Ka Ọ Mara Ihe Ọ Ga-Amụ Ma Ọnwa Ruo Ya

Sep 24, 2020 - 23:54
Jan 24, 2021 - 23:54
 0
Otu Nwoke Ebewaala Nwunye Ya Dị Ime Afọ Ka Ọ Mara Ihe Ọ Ga-Amụ Ma Ọnwa Ruo Ya

Si n'aka Izunna Okafor

Igbo sị na onye ọ na-agụ ebeghị ebi na-eri n'eghèghị èghè.

Ka ọ dị taa, otu nwoke nọrọ na nsonso a wee bèwaa nwunyè ya dị ime afọ, iji mara ma ọ bụ ime nwoke ka ọ dị ma ọ bụ ime nwaanyị; ka o wee mara nke ọ ga-amụrụ ya ma ọnwa ruo ya. Nke a bụ nke mere n'obodo Budaun dị na mpaghara steeti Uttar Pradeshmba nke mbà India.

Dịka akọkụ siri kọọ, ya bụ nwoke mere ihe ahụ, bụ Maazị Pannalal gbàrà ahọ iri anọ na atọ. Nwoke ahụ ka e kwuru na o ji ụmụ ise ugbua mana ha ise bụcha nwaanyị, nke mezịrị o ji achọsi nwa nwoke ike agara-aghara.

Ka o sila dị, n'ihi na nwoke ahụ na-achọsi nwa nwoke ike, o jidezịrị nwunye ya dị ime ọnwa oruru, bụ  bụ Oriakụ Anita Devi (gbara ahọ iri atọ na ise) n'ótù abalị, wee bèwáá ya afọ, ka ọ mara ma ọ bụ nwa nwoke ka ọ bụ nwa nwaanyị ka o bu n'afọ, n'ihi na ike ịmụ naanị nwa nwaanyị agwụla ya.

Nke a mezịrị ka nwaanyị ahụ dị ime nọrọ na nnukwu ihe mgbu na ahụ ụfụ, n'ihi afọ di ya bèwàrà ya; ọbara wee ju ebe niile n'abalị ahụ. E bukwàzịrị ya bụ nwaanyị wee gaa ulọọgwụ, ebe ọ nọ anara ọgwụgwọ ugbua; mana site na amara Chineke, o nweghị ihe ọbụla mere nwa o bù n'afọ.

Oge a gbara ya ajụjụ ọnụ banyere ihe o mere, Maazị Pannalal kwuru na ya nwèrè ụmụnwaanyị ise, ma sịkwa na nwa ya nwoke nwụrụ anwụ. O kwukwara na ya amaghị ụma wee bèwaa nwunye ya afọ.

Ka ọ dị taa, ndị uweojii anwụchiela ya bụ nwoke, ebe nnyòcha ka na-agakwa n'ihu ugbua banyere ihe ahụ o mere, nke mgbe e mechààrà ya, a kpụpụ ya ụlọikpe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.