Otu Onye Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ n'Anambra

Sep 2, 2021 - 22:13
 0
Otu Onye Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ozi si n'aka ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem awele n'okporoụzọ n'ala Nigeria, bụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)', ngalaba steeti Anambra na-akọwa na otu nwoke anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti ahụ na nsonso a.

Onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ FRSC n'ime steeti ahụ, bụ DRC Margaret B. Onabe bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàrà na mpaghara Nteje, dị nso na njikọ ụzọ Awkụzụ, n'ogologo ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha, ma bụrụkwa nke mere ka oge o jiri nkeji iri abụọ na anọ gata elekere iri na abụọ nke ụbọchị Tuzdee.

O kwuru na ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtara n'etiti onye na-anyà nnukwu ụgbọala 'Mercedes  911' (nwere akàrà GDD630XA), bụ Maazị Ikenna Ozonwadinkpa, nà onye na-anya ọgbatumtum Jencheng (nwere akàrà ZLL 108 QU), bụ onye a maghị onye ọ bụ.

DRC Onabe gara n'ihu mee ka a mara na ihe mberede okporoụzọ ahụ mètụtàrà mmadụ ise, nke gụnyere ụmụnwoke anọ na otu nwaanyị, ma kwukwa na otu nwoke n'ime ha nwụrụ, ebe otu nwaanyị ahụ nwetara ihe mmerụahụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ọ bụ ịgba oke ọsọ ka e kwuru na ọ bụ ya kpatara ihe mberede okporoụzọ ahụ. Ọ sị na ndị ọnọmgbeomere kwuru na onye ọgbatumtim ahụ nọ n'oke ọsọ, chọọ iji ọsọ wee gbafere nnukwu ụgbọala ahụ, wee dànyeziere ya adanyere, kpọrikọọ onwe ya.

E burukwazịrị ndị ahụ ihe mberede ahụ metụtara wee gaa ụlọọgwụ 'CHIRA Hospital' dị nso n'ebe ahụ, bụ ebe dọkịta nọrọ wee lelechaa ha ahụ ma gbaa akaebe na otu nwoke n'ime ha, bụ onye ahụ na-anyà ọgbatumtum anwụọla. A dọnyezịkwara ozu ya n'ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ ahụ, ebe ndị ọrụ FRSC gbakwazịrị mbọ bupusie ihe dachisiri ụzọ, iji gbochie inwe agbakata akwụrụ n'ebe ahụ.

N'okwu ya banyere ya bụ ajọ ọdachi, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra bụ Maazị Adeoye Irelewuyi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka ha na-akpachapụ anya oge niile, zèére ịgba oke ọsọ, ma jirikwa nwayọ na uchè na-anyà ụgbọala. 

O kwuru na ọ bụ ịgba oke ọsọ na-ewetakarị ọkà n'ọnụọgụgụ ihe mberede okporo ụzọ na-adapụta aghara aghara na mpaghara ebe dị iche iche steeti ahụ. O chètààrà ha na oji nwanyọ anaghị emerụ ahụ, ma dụọ ha ka ha zèére ịgba oke ọsọ, ọkachasị ugbua a na-achọkwa ịbànye na mmemme ekeresimeesi koọmkwem.

Dịka ọ na-ekpe ka onye nke nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporo ụzọ ahụ gbakere ngwangwa, CC Irelewuyi kasikwazịrị ezinụlọ onye nke ha nwụrụ anwụ obi, kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụ obi onye ahụ nwụrụ anwụ ezumike udo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484