Òtù Ọrụ Obi Ebere 'Amaka Care Foundation' Akwàdola Ndị Ikedịnobi

Dec 5, 2019 - 20:19
Jan 24, 2021 - 03:43
 0
Òtù Ọrụ Obi Ebere 'Amaka Care Foundation' Akwàdola Ndị Ikedịnobi

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na onye na-emepùrú nwaogbenye na-emepùru chi ya. N'ịgbasò nke a, ótù òtù ọrụ obi ebere, a maara dịka 'Apostle Amaka Care Foundation' nọrọ n'isi ngwụcha izuụka gara aga wee nye ihe nkwàdo na onyinye dị iche iche nyégara imirikiti ndị ụwa na-atụ n'ọnụ nakwa ndị ike dị n'obi, bụ ndị a maara dịka ọlụsị.

Oke mmemme oriri na ọñụñụ nke a nọrọ na ya wee kesaa ya bụ ihe nrita bụ nke weere ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị ọlụsị sitere ebe dị iche iche na steeti ahụ nà mpụga ya sònyèrè na ya.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onye haziri ya bụ ọgbakọ ma bụrụkwa onyeisi òtù ọrụ obi ebere ahụ, bụ Nwaada Amaka Akigwe kwuru na atụmatụ ahụ hìbèrè isi n'ibèlàta ahụhụ ụfọdụ ndị mmadụ na-ata, ma mee ka a mara na inyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka bụ ndụmọdụ na ntuziaka sitere n'akwụkwọ nsọ.

Ka ọ na-akpọpụtasị ebe dị iche iche ọ chịkọbàgòro ụdị ihe mmemme ahụ na mgbe gara aga; o kwuru na ihe na-akpali mmụọ ya ime nke ahụ bụ okwu Onyenweanyị kwùrù n'akwụkwọ Matiu isi nk iri abụọ na ise, malite n'amàokwu nke iri atọ na ise wee ruo nke anọ na ise. Ọ sị na ya nwèrè ebumnobi na ọhụhụ ụzọ iguzobe ụlọ maka ụmụaka enweghị nne enweghị nna, ya na ebe a ga na-elekọta ndị agadi, ma kpee ka Chineke nyere ya aka ime ka ya bụ nrọ pụta ìhè, ọbụnadị dịka ọ rịọkwazịrị nkwàdo gọọmenti na ndị ọzọ ọrụ obi ebere na-amasị, iji mee ka ya bụ ezi nrọ pụta ìhè.

N'okwu ha gwàrà Ka Ọ Dị Taa n'otu n'otu, ụfọdụ ndị sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Oriakụ Gold Emejulu, na Ogoo Amobi (bụ ndị òtù Nzukọ Ụmụada Idemili North na South); Oriakụ Amaka Tamụnọ; Oriakụ Añụlịka Akigwe, na Maazị Osita Chukwu kọwara ya bụ mmemme dịka nke magburu onwe ya, n'ihi na, dịka ha siri kwuo, ya bụ nwa amadi anaghị eme ihe ahụ n'ịtụ anya na ndị ahụ ga-akwụghàchi ya ụgwọ maka ọrụ ọma ya, kama na ọ na-eme ya n'ụdị ịgbaso ụkpụrụ akwụkwọ nsọ na ntụziaka Chineke.

Ha jàkwàzịrị ya ike, rịọ ya ka ọ ghara ịda mbà n'ọrụ ọma ahụ ọ na-abàgide, ma nyekwazie ya owuwe anya na ụgwọ ọrụ ya dị n'aka Chukwu, bụ onye ji aka ya ele ọrụ, ma n'ụwa, ma n'eluigwe.

Na nzaghchi ha, n'aha ndị ritara úrù n'ọrụ obi ebere ahụ, nnukwu nne nke ụlọakwụkwọ ndị ikedịnobi, bụ "Special Education Center for the Blind, Deaf and Dumb, Oji River" dị na steeti Enugu, bụ Oriakụ Christiana Ilechukwu, nà otu nwata akwụkwọ na-agụ ebe ahụ, bụ Maazị Moses (bụ ndị nwegbàdòrò nsogbu anya) kọrọ akụkọ bànyere ụzọ dị iche iche Nwaada Amaka sìgòrò meere ha na ụlọakwụkwọ ha ọgọ n'oge gara aga, ma kpekwazie ka Chineke nna gọzie ma kwụghàchi ya mmaji kwuru mmaji.

Ihe ndị pụtakarịchara ìhè na mmemme ahụ gụnyèrè: ịwa achịcha bekee e mèrè maka mmemme ahụ, ịgba egwu, igosipụta ihe dị iche iche ndị ikedịnobi ahụ rụpụtàgàsịrị, tinyere inye ha ihe oriri, ihe nkwàdo dị iche iche, na ego, tinyere ihe ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.