Òtù 'Wikimedia Fan Club' Enweela Ọ́gbakọ̀ Nkụzi n'Awka

Nov 16, 2021 - 22:57
 0
Òtù 'Wikimedia Fan Club' Enweela Ọ́gbakọ̀ Nkụzi n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọgbakọ inye nkụzi banyere idezi, ịtụgharị, itinye na ibipụta okwu ọhụrụ na Wikipedia abịala na njedobe n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, dịka a kpọkuru ndị Igbo ka ha nye aka n'ịkwàlite asụsụ ha.

Ya bụ ọgbakọ ọzụzụ bụ nke a chịkọbara site n'aka ndị otu 'Wikimedia Fan Club', ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kpọkuo ndị Igbo ka ha nye aka n'ichekwaba, ịkwàlite na ime ka ya bụ asụsụ Igbo ná-ewu èwù n'ogoogo mba ụwa.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onye hibere òtù 'Wikimedia Fan Club', ma bụrụkwa onye chịkọbara ya bụ ọgbakọ, bụ Oriakụ Obiageli Ezeilo, bụkwá onye ihe gbasaara nkwàlite asụsụ Igbo na-atọ ụtọ, kwùrù na ebumnobi o jiri hibe òtù ahụ nà atụmatụ ahụ bụ iji kwàlite ma bawanyekwuo ọnụọgụgụ edemede na okwu Igbo dị na Wikipedia, ma sikwazie n'ụzọ dị eti ahụ mee ka asụsụ Igbo guzosie ike ma gharakwa ịnwụ maọbụ fuo dịka ndị òtù mba ụwa 'United Nations Educational, Scientific and Cultural Organisations (UNESCO)' siri wee buo n'amụma na mgbe gara aga, sị na asụsụ Igbo ga-anwụ oge adịghị anya.

Ọ kọwakwara na òtù ahụ na atụmatụ ahụ ga-enyekwa aka itinyesikwu ọtụtụ okwu Igbo dị icheiche n'akwụkwọ nkọwaokwu igbo dị na Wikipedia, bụ Wikishọnarị, mee ka asụsụ ahụ na-ewu èwù n'ala Nigeria na n'ogoogo mba ụwa, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ dị icheiche ọ ga-eweta.

Dịka ọ na-eme ka a mara na isonye na nkụzi ahụ bụkwa n'efu ma bụrụkwa maka onye ọbụla nwere mmasị, Oriakụ Ezeilo mekwara ka a mara na a ga na-enwe ya bụ ọzụzụ kwà ọnwa ọbụla. 

Ọ kpọkukwazịrị ndị sonyere na mmemme ahụ ka ha gba mbọ na-etinye ihe niile a kụziiri ha n'ebe ahụ n'ọrụ ma jirikwa ya na-emepụta ihe oge niile, dịka nkụzi e nyere ha siri dị. Ọ dụkwàrà Ndị Igbo ọdụ ka ha nye aka ịkwàdò, ịkwàlite na ichekwaba asụsụ ha.

Na ntụnye nke ya, otu onye so enye aka n'ịhazi atụmatụ ahụ, ma bụrụkwa onye nkụzi na ngalaba Asụsụ Igbo na Mahadum Nnamdị Azikiwe, bụ Oriakụ Edith Nwobu gara n'ihu kọwaa na ebumnobi ọgbakọ ahụ bụ iji kụziere ndị mmadụ etu ha ga-esi na-etinye maọbụ na-emezi okwu maọbụ edemede na Wikipedia, ọkachasị dịka o siri metụta edemede maọbụ okwu Igbo.

Oge ọ na-ekele ndị sonyere n'ọzụzụ ahụ maka ịhụta mkpa ọ dị ime nke ahụ, o kwupụtakwara olileanya o nwere na ya bụ atụmatụ nà nkụzi e nyere ga-enye aka n'ụzọ dị ukwuu, n'ịkwàlite na ichekwaba asụsụ Igbo, ma ọ bụrụ na e tinye ihe niile a kụziri n'ebe ahụ n'ọrụ nke ọma ma na-emekwa ya oge niile.

N'okwu nke ya, otu onye n'ime ndị sonyere n'ọgbakọ ọzụzụ ahụ, ma bụrụkwa nwataakwụkwọ ngalaba Asụsụ Igbo na mahadum UNIZIK, bụ Prince Uche Ezeabasịlị kèlèrè ndị ahụ chịkọbàrà ya bụ ọmarịcha ọgbakọ maka ohere ọma ahụ; gbáá akaebe na ọ mụtàrà ọtụtụ ihe n'ebe ahụ; ma kwezie nkwà itinye ihe niile ọ mụtara n'ebe ahụ n'ọrụ ma na-emekwa ya oge niile, iji si n'ụzọ dị etu ahụ tụnye ụtụ nke ya n'ichekwaba na ịkwàlite asụsụ Igbo, maka na ọ naghị adị mma ọkụ a gụnyere nwata n'aka ịnyụnahụ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484