Otutu umu Nigeria anwuala n’ala bekee site na ita ahuhu

Otutu umu Nigeria anwuala n’ala bekee site na ita ahuhu

Jul 6, 2014 - 05:04
Jan 20, 2021 - 05:04
 0
Otutu umu Nigeria anwuala n’ala bekee site na ita ahuhu

Ndị Nigeria bụ oji abalị eme ihe. Ha abụghị kwa oji abalị eje, ndị ekperima cha cha! Kama na ọ bụ mgbe ohere dapụtara ha iji gbo mkpa nke ha. Dịka agwa ndị e nwe enwe ha na-emechasị ihe ọga chọrọ, tupu ha nwee ohere ime ihe nke dị ha mkpa.

Ndị Nigeria bịara obodo Amerịka dịka ndị ohu. Ha enweghị oge nke aka ha. Mgbe ha lụchasịrị ọlụ ndị nwe obodo nyere ha ka ha lụọ ha ji enweta ego ịkwụ ụgwọ ụlọ, ụgwọ ụgbọ ala ukwu ha na-agba, na ụgwọ mmiri, ụgwọ ọkụ, ụgwọ igwe e ji ekwu okwu, ụgwọ gasị, na ihe oriri, chi ejie.

Ndị Nigeria bụzịkwa ụsụ ji abalị eje. Ha bụkwa oke na akpagharị n’oge abalị mgbe chi jiri. Ihe a bụ ihe nwute. Ụmụ Nigeria nọ n’obodo oyibo atagbuola onwe ha n’ahụhụ, ebe ndị na-achị ala Nigeria nile nọ na-ebi ka Dantata. Ha na-ebi ka ha ọ bịara ụwa nke ha iche. Tụfịakwa!

Ọtụtụ ụmụ Nigeria anwụala n’ala bekee site na ịta ahụhụ. Ọ na-agbawa obi na ndị na-achị ala Nigeria achọdịghị ịma na onye bịara ije nwe ụla. Anyị amụala ụmụ n’ala bekee, ha amaghịkwa ebe ala nna na nne ha bụ. Maka na ndị na-achị obodo Nigeria achọghị ịma. Azị gba.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.