Poopu Francis Ahọpụtala Bishọọpụ Ọhụrụ na Dayọsiisi Abakaliki

Jul 11, 2021 - 20:35
 0
Poopu Francis Ahọpụtala Bishọọpụ Ọhụrụ na Dayọsiisi Abakaliki

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onyeisi ụka Katọliiki n'ụwa gbaa gburugburu, bụ Poopu Francis ahọpụtala Fada Peter Nworie Chukwu, bụ ụkọchukwu n'ụlọụka 'St. Patrick’s Catholic Church, Nduruku-Amagu' dịka bishọọpụ ọhụrụ nke dayọsiisi Abakaliki.

Onye na-anọchite anya Poopu Francis n'ala Nigeria, bụ Anthonio Filipazzi bụ ya kwupụtara nke a n'Abụja site n'ọnụ odeakwụkwọ isi ụlọọrụ ụka Katọliiki n'ala Nigeria, bụ Fada Zacharia Samjumi.

Fada Peter Nworie Chukwu ahụ a kpọlitere n'ọkwa ọhụrụ bụ onye nkuzi mahadum na mahadum steeti Ebonyi dị n'Abakaliki bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa onye a mụrụ n'abalị ise nke ọnwa Nọvemba ahọ 1965, n’Ededeagu Umuezekohohu dị na dayọsis Abakaliki.

Ọ gụrụ akwukwọ n'ụlọakwụkwọ 'Seat of Wisdom Seminary, Owerri' dị na steeti Imo na 'Bigard Memorial Major Seminary, Enugu' tupu e chie ya Fada na July 3, 1999. O mechakwara gaa ala bekee gụọ akwụkwọ na 'Franciscan University of Steubenville, Ohio US' na Milwaukee, dịkwa na mba US, ebe o tuuru ugo mmụta PhD n’ihe ọmụmụ 'Philosophy'.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484