Izunna Okafor dere abụ a



Pokopoko ka ị na-egbu

Ma n'anya mmụọ ma n'anya mmadụ  

Mmịmị ọnụ ọcha

Chaị, lekene nwaada na mma

Jacinta

Taa bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ gị 

Elu na ala na-agba akaebe

Maka ọrụ ọma gị na afọ ọma gị.

Nne ị chara akwụ

Agbara nwaanyị

Naanị na ị na-emezị ihere nke ukwuu

Mana o nweghị ihe nke ahụ bụ

Maka na ọ bụ ihe nnekwu ọkụkọ nwere ka o ji emere okeọkpa ngàla.

Mma gị adịghị n’ótú Ọnịtsha

Maka na ihe dị ụtọ bu ihe dị ụkọ

Ọ bụ ezie na e nwere adịgbòlója

Mana ihe a gba n’aka

E jighi ènyò ele ya

Mma bụ ego

Mma bụ àgwà

E nwerekwara mma ihu

Mma dịkwazị n'ụbụrụ

Mana i nwegbàdoro ha niile.

Odeakwụkwọ ibe m

Ya gaziere gị

Ị chara ihe ị ga-acha

Mana ka m gbadozie ya ebe a

Maka na ọ na-abụ e soro ụtọ abụba, e jee ohi nkịta

E sorokwa ụtọ àkwá, e jee ohi ọkụkọ.

Ọ na-abụkwa oke mmanwụ nọkarịa n'ọgbọ

Ụmụọkpụ ekenye ya ụtụ

Mana, ka o sila dị

Nne, ka m kwụkwa ya ọzọ

Nezie n'ezie 

Ị mara mma

Onye ekweghị ekwetara m ya.

Ọñụ na ncheta ụbọchị ọmụmụ gị, nwaanyị ọma.

YOUR REACTION?