Izunna Okafor

Omenala bụ ọbara na-ehù na ndụ àgbụrụ, ma bụrụkwa nwata tote o tokwuru. Nke a bụ nke pụtara ihè n'ozùzuoke, dịka Ndi Ezi-Agulu Aguleri, bụ obodo dị n'okpuru ọchịchị 'Anambra East' nke steeti Anambra, merùbèrè emume Olili Ọnwa Ịsaa nke ahọ 2020, bụ otu nnukwu mmemme e jiri mara obodo ahụ.

Ya bụ oke mmemme wééré ọnọdụ n'ogige Ama-Ụmụala dị n'obodo ahụ, bụ mmemme omenahọ dịgoro ọkpụrụtọrọkpụ n'obodo ahụ, ma bụrụkwa nke a na-eme n'ọnwa Ọkụtoba kwà ahọ.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisioche 'Ikenga Ezi-Agulu Forum', bụ Maazị Basil Manafa kọwara na mmemme ahụ nwere ihe jikọrọ ya na Alọmmụọ, bụ mmemme iri ji ọhụụ obodo ahụ, bụ nke a na-emegide wee ruo Ọnwa Ịsaa.

Ya bụ mmemme, dịka o siri kọwaa, bụ nke ebumnobi ya bụ ịkwalite omenala, ijikọ obodo ahụ ọnụ na ịkwàlite Eziagụlụ Ụnọ site n'iwèpụta atụmatụ mmepe bụ ịgbà, na ịkwàlite ịdịnotù, udo na ịhụnanya, nakwa ịgbà ụmụafọ obodo ahụ ume.

N'okwu nke ya, eze ọdịnala obodo Enugu Agụleri, bụ Igwe Ezechukwu Emeka-Eri kọwara omenala dịka otu ndị si ebi ndụ ha, ma kwuo na obi dị ya ụtọ banyere etu mmemme ahụ si akwàlite ma na-egosipụta ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo nakwa nke ndị obodo ahụ.

Na ntụnye ya, Kọmishọna na-ahụ maka omenala na njem nlegharịanya na steeti ahụ, bụ Dọkịta Christian Madubuko kèlere ndị obodo ahụ maka ịhazi oke mmemme ahụ kwa ahọ ọbụla bụ nke sigoro n'ụzọ dị iche iche wee kwalite njirimara na omenala Igbo.

Dịka ọ na-akọwa na omenala bụ ihe dị oke mkpà ma bàkwa ọtụtụ urù na ndụ agbụrụ ọbụla, ya bụ Kọmishọna kọwàrà na ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ agaghị ada mbà n'ịkwalite omenala Igbo, ma kpọkukwazie ndị obodo ahụ na ụmụafọ Igbo nọ ebe dị iche iche ka ha gharakwa ikwe ka asụsụ na omenala Igbo fuo maọbụ nwụọ dịka e buru n'amụma, kama ka ha jigidesie ya ike ma na-asụkwa asụsụ Igbo oge niile, na-akụzikwara ụmụ ha.

A nọrọ na mmemme ahụ rie ma ñụọ, gbakwa egwu ọdịnala ma mekwa ihe ngosi dị iche iche nke gụnyere ịkwa abụ, ịzọ ọkịka, ịpịa Agba, iti mmọnwụ ịgbaike na ụfọdụ ihe ndị ọzọ mere ka ya bụ mmemme dàá ụdà.

YOUR REACTION?