RoLAC na Gọọmenti Anambra Eweputela Akwụkwọ Maka Asụsụ Mmegharịahụ

Apr 15, 2021 - 15:59
 0
RoLAC na Gọọmenti Anambra Eweputela Akwụkwọ Maka Asụsụ Mmegharịahụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Njikọaka gọọmenti steeti Anambra na òtù 'Rule of Law And Anti-Corruption, RoLAC' amịtakwala ezi mkpụrụ ọzọ, dịka òtù abụọ ahụ bipụtara ma wepụta akwụkwọ ndekọta nkọwa maka asụsụ mmegharịahụ.

Mwepụta akwụkwọ ahụ a kpọrọ (na bekee) "Directory Of Sign Language Interpreters" bụ nke weere ọnọdụ n'Awka ma bụrụkwa nke RoLAC mere site na njikọaka ụlọọrụ gọọmenti steeti Anambra na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị. 

Ya bụ akwụkwọ ndekọta bụ nke depụtasịrị aha mmadụ niile e nyere ọzụzụ n'asụsụ mmegharịahụ (sign language) na steeti Anambra nà ihe ndị ọzọ dị mkpa banyere ya bụ asụsụ na ndị na-akọwa ya. 

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi RoLAC na steeti Anambra, Oriakụ Josephine Onah kèlere gọọmenti steeti Anambra maka nkwàdo dị iche iche ọ na-enye ndị ikedịnobi, bụ ndị nwere nkwarụ n'otu akụkụ ahụ ha maọbụ nke ọzọ.

O mere ka a mara na ọchịchị Gọvanọ Obiano enyele ndị ikedinobi ohere na ezi ọnọdụ kwesiri ekwesi ma mee ka ha soro n'ihe a na-eme na gọọmenti ya, ma kwezie nkwa ịga n'ihu n'ịkwadò ezi njikọaka ahụ dị n'etiti gọọmentị ya na òtù RoLAC.  

O mere ka a mara na akwụkwọ ahụ ga-enye aka imechi oghere ahụ dị n'etiti ndị àhụ ha zuru oke na ndị àhụ ha ezuchaghị oke na steeti ahụ, dịka o siri metụta inwe mkparịtaụka, nye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ibelata mmekpa ahụ na arụrụala megide ndị ọlụsị, nye aka ịkwalite ikike dịịrị ha, ma nyekwa aka n'inwetara ha ikpe nkwụmọtọ oge ọbụla mmadụ megidere ikike dịịrị ha.

Na ntụnye nke ya, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ndị ikedịnobi, bụ Ọkaiwu Chuks Ezewuzie kèlere Chineke maka ime ka atụmatụ na ihe niile gbasaara iwepụta akwụkwọ ahụ gaa siriri-werere.

Dịka ọ na-ekele ndị òtù ya, ndị RoLAC, na ụlọọrụ gọọmenti steeti Anambra na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka ba ụmụnwaanyị, maka
nkwụdosiike ha, Ezewuzie kelekwara aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ na nwunye ya bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ maka nkwàdo ha nyégárá ndị ọlụsị n'ime steeti ahụ, bụzị nke na-egosipụta na Gọvanọ Obiano bụ Gọvanọ kacha bụrụ enyì ndị ọlụsị kemgbe okike steeti ahụ.

O kwezịrị nkwa na ha ga-aga n'ihu ijikọ aka ọnụ, ha na ụlọọrụ dị iche iche kwesiri ekwesi, iji kwàlite ezi ọnọdụ maka ndị ọlụsị na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484