Steven Harper: “Kanada agaghi eziga ndi agha na Mali

Steven Harper: “Kanada agaghi eziga ndi agha na Mali

Jul 6, 2014 - 04:54
Jan 20, 2021 - 04:54
 0
Steven Harper: “Kanada agaghi eziga ndi agha na Mali

Onye isi ọchịchị mba Kanada, Steven Harper, ekwuona na Kanada adighị njikere iziga ndị agha na mba Mali, na-agbanyeghị na ndị Al-kaida juputeziri na Mali.

Harper kwuru nke a taa, oge ya na Thomas Boni Yayi, onye isi mba Benin Ripọblik, bụrụkwa onye isi otu jikọtara mba Afrịka, na-akparị ụbọbọ.

Lee ihe Mazị Harper kwuru na bekee:

"The government of Canada is not considering a direct Canadian military mission…Obviously, we are providing humanitarian aid to this region, which is important."

“Gọọmenti mba Kanada anaghị atụ anya izika ndị agha na Mali… Ihe dị mkpa bụ na Kanada na-eziga akara ngwa na ihe e ji enyere ndụ aka na mpaghara ahụ”

Harper kwuputere okwu a mgbe Mazi Yayi gwara ya na ha chọrọ ka ndị agha otu NATO nyere ndị agha otu jikọrọ mba Afrịka aka chọọ ihe a ga-eme gbasara mba Mali. N’ọnwa maachị gara aga, e weere ọchịchị n’aka ike na Mali. Kemgbe ahụ, mpaghara ugwu mba Mali nọzi n’okpuru otu otu ha na ndị Al-Kaịda na-adị na mma.

N’ọnwa disemba gara aga, otu jikọrọ mba ụwa kpebiri iziga ndị soja mmadụ 3,000 na Mali.

N’aka nke ọzọ, Kanada kwere nkwa ịnye mba Benin Rịpọblik nde dollar 18, maka ihazi usoro e si anakọ ụtụ isi na mba ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.