Taa ka ndi mmadu na-achu afo

Taa ka ndi mmadu na-achu afo

Jul 6, 2014 - 04:50
Jan 20, 2021 - 04:51
 0
Taa ka ndi mmadu na-achu afo

Taa ka a na-achụ afọ. Taa bụ abalị mbụ nke ọnwa jenụwarị ka a na-achụ afọ n’ebe dị iche iche. E jiri ọkpụkpa ọkụ nọkaụtụ mara ịchụ afọ.

O wete aka n’elekere 12 nke abalị, a na-amụnye ọkụ nọkaụtụ na mpaghara ụwa dị iche iche maka ịchụ afọ. Ndị mmadụ na-agbakọọ maka ilekiri ọkpụkpa ọkụ a.

Obodo ọbụna nwere omenaala ha na-eme, ha ji ajụ afọ. Ọtụtụ mmadụ na-aga n’ụlọ ụka kpegide ekpere were nabata afọ ọhụrụ.

Anyị hụtara omenaala ndị Amerịka n’isi ụtụtụ taa na New York. Ka ọ na-ewete aka n’elekere 12 nke ime abalị, a tụdara oke bọọlụ Confetti. Ndị mmadụ malitere gụdawa nkeji, ruo mgbe ọ kụrụ elekere 12 kpọmkwem. Mgbe ahụ ka afọ 2013 malitere na New York.

Anyị bụ ndị Igbo Radio na-ekele Chineke maka ndụ na ike o nyere anyị iji na-akọrọ ụmụ Igbo bi ebe dị iche iche ihe na-eme n’ụwa n’asụsụ Igbo.

Asụsụ mba dịkwara mba. Asụsụ ndị Igbo dịkwara ndị Igbo n’afọ 2013. Chineke ekwekwana ka e megbuo anyị ma ọ bụ napụ anyị asụsụ anyị. Amen.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.