Trump akpọna George Papadopoulos onye ashị

Trump akpọna George Papadopoulos onye ashị

Oct 31, 2017 - 18:41
Jan 19, 2021 - 18:42
 0
Trump akpọna George Papadopoulos onye ashị

George Papadopoulos, otu n’ịme ndị otu Donald Trump ekwetena n’ịkpe mara ya. Robert Mueller, onye nnyocha pụrụ ịche ahụ a họputara maka ịleba anya na nrụrụ aka na igwu ojoro n’etiti Donald Trump na ndị Rọshịa, kwuputere nke a n’ụbọchị Mondee, mgbe ọ gbara mmadụ abụọ ndị otu Trump akwụkwọ.

Mueller gbara Paul Menafort, onye bụbu onye isi ndị ọrụ ndọrọdọrọ ọchịchị nke Trump, yana Rick Gates, onye rụkwara Trump ọrụ n’oge ndọrọdọrọ ọchịchị, akwụkwọ.

Papadopoulos bụ onye mbụ a magoro ịkpe na nnyocha ahụ ndị Amerịka na-eme.

N’ọnwa Julaị afọ a, Mueller gbara George Papadopoulos ajụjụ ugboro ole n’ole iji chọpụta ịhe ọ mara gbasara mmekọrịta Trump na ndị mba Rọshịa.

Mueller mechara kpọpụ George Papadopoulos n’ụlọ ịkpe maka ịtụrụ ndị ọrụ nnyocha FBI ashị. Papadopoulos mechara kwete na ịkpe mara ya.

A na-atụ anya na Papadopoulos na-enyere Mueller aka n’ọlụ nnyocha ya kemgbe ahụ, maka ịwetunata ntaramafụfụ dịrị ya na mkpọrọ.

E nwebeghị ịhe anyị nụrụ Papadopoulos kwuru megide Trump ma ọ bụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya. Mana, taa bụ Nwenezdee, Trump malitere kpọwa Papadopoulos onye ashị, site n’ozi o siri na Twitter zipute.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.