Ụfọdụ Anwụọla, Dịka Ndị Òtù Shi’ites na Ndị Ọrụ Nchekwa Kwàtụrụ n'Abuja

Sep 28, 2021 - 21:53
 0
Ụfọdụ Anwụọla, Dịka Ndị Òtù Shi’ites na Ndị Ọrụ Nchekwa Kwàtụrụ n'Abuja

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ dike zute dike ibe ya n'ụzọ, a mara akanwụ na ụtaba nke na-akpọlite uzere.

Ka ọ dị taa, a na-atụ anya na ụfọdụ ndị mmadụ nwụrụ, ebe ụfọdụ ndị ọzọ nwètèkwara mmerụahụ na nsonso a, dịka ndị otu okpukperechi Shi’ites na ndị ọrụ nchekwa kwàtụrụ n'Abụja, bụ isi obodo ala Nigeria.

Dịka ozi e nwetere siri kọwaa, ndị òtù 'Islamic Movement in Nigeria (IMN) a maara dịka ndị òtù Shi’ites na-abàgide na mmemme omenahụ ịga ije ha a maara dịka 'Arbaeen Trek' n'okporoụzọ '3rd Avenue, Gwarimpa District' dị n'Abụja, tupu ndị ọrụ nchekwa buru ụgbọala wee wụchaa n'ebe ahụ ozigbo, malite ịwakpò ha, n'elekere asatọ nke ụtụtụ ụbọchị Tuzdee.

Akụkọ kọrọ na égbè malitere daba aghara-aghara ngwangwa ndị ọrụ nchekwa ahụ wụchàrà n'ebe ahụ, bụkwa e sitere na ya gbagbuo ụfọdụ ndị mmadụ, ma ndị na-agara onwe ha n'okporoụzọ ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na mpaghara FCT, bụ Josephine Adeh kọwara na nkwàtụ ahụ na ọgbaghara so ya mezịrị ka ụzọ awara-awara Gwarinpa-Kubwa kpọchie kpamkpal ma tinyekwazie ndị na-eme njem n'ihe nhịahụ.

O kwuzịrị na mgbataọsọ ndị uweojii n'ebe ahụ sozịrị nye aka ime ka okporoụzọ ahụ kpọghee ma gabakwa agaba. Ọ kọwara na a matachabeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole nwụrụ n'ebe ahụ n'ihi ọdachi ahụ, ma kwezie nkwa na ọ ga-ewepụta ozi n'ozuzuoke banyere nke ahụ, ngwangwa e mechara nnyocha banyere ya bụ nsogbu dapụtara.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484