Ụgbọala Na-Ebu Mmanụ Ọkụ Agbagwòóla n'Anambra, Gbuo Otu Nwoke

Jan 15, 2020 - 23:55
Jan 24, 2021 - 02:24
 0
Ụgbọala Na-Ebu Mmanụ Ọkụ Agbagwòóla n'Anambra, Gbuo Otu Nwoke

Izunna Okafor, Awka

Arịrị zụrụ, anyammiri tàsịsịkwàrà ụbọchị Tuzdee na steeti Anambra, dịka otu nnukwu ụgbọala na-ebu mmanụ ọkụ, bìnwùùrù ọkụ, gbagwòó, ma gbuokwa ótù onye na mpaghara ebee si abànye Amawbịa, bụ Amawbịa By-pass dị n'okporo ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu Gaa Ọnịtsha.

Ya bụ nwa amadi ajọ ọnọdụ ahụ tàrà isi ya, ka e kwùrù na ọ bụ onye na-edozi ụgbọala, ma bụrụkwa onye na-arụ ọrụ n'ụgbọala ahụ, tupuu o wee bìnwuru ọkụ, bụkwa nke butere ọnwụ ike ya.

N'okwu ya bànyere nke ahụ onyeisi ụlọ ọrụ nsọnyụ ọkụ na steeti ahụ, bụ Maazị Martin Agbili kwùrù na ha nwètàrà òkù gbanụgbanụ site n'aka ndị uwe ojii, banyere nke ahụ, bụzị nke mere ha jiri kwado ọrụ ozigbo ozigbo, ma bukọrọ ngwaọrụ ha gbara gaba n'ebe ahụ, wee sọnyụọ ya bụ ọkụ.

O kwùrù na a chọpụtabeghị ihe kpatara ya bụ ọkụ, ma kpáá uche na o nwère ike bụrụ na ụfọdụ ihe na-ághọrọ ọkụ ma ọ bụ ihe na-akpali ọkụ dị n'ime ụgbọ oloko ahụ, bụ nke dọgháára ọkụ n'ihi otu ihe ma ọ bụ nke ọzọ oge ahụ a na-arụ ọrụ na ya.

Ka ọ na-adụ ọhanaeze ka ha na-ezite ozi iji mee ka ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ mara ma nọrọkwa nso oge ọbụla ụdị ụgbọala ahụ bú mmanụ ọkụ nweere nsogbu, maka adịghị ama ama; Maazị Agbili kpọkùzịkwara ndị na-arụ ụdị ọrụ ahụ ka ha nwee atụmatụ n'ọdụ ọrụ ha dị iche iche, maka nchekwa ọkụ ọgbụgba, iji hụ na ụdị ajọ ọdachi ahụ adapụtàghịzị ọzọ n'ọdịnihu.

Na ntụnye nke ya, otu onye ọnọ mgbe o mèrè, bụ Maazị Emeka Ifejiọfọr kọwara na ya bụ ụgbọala adịchaghị ọcha, nke bụ na o nwere ike bụrụ mmanụ ọkụ gbasasịrị n'ahụ ya mère ọkụ ahụ jìrì binwuru ọkụ.

Onyeisi ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ Maazị John Abang dùùrù ndị òtù ọrụ ya wee garuo n'ebe ahụ ya bụ ebenebe nọrọ wee gbuo, iji were anya ya hụ.

Ndị ọrụ sítere ụlọ ọrụ nchekwa dị iche iche, nke gụnyere ndị ọrụ uwe ojii, ndị nchekwa ndị nkịtị, bụ ndị a mààrà dịka 'Nigerian Security and Civil Defence Corps,' ndị ọrụ na-ahụ maka ime njem awele okporo ụzọ, bụ 'Federal Road Safety Corps,' tinyere ndị ọzọ, nọkwa gidigbam n'ebe ahụ wee na-arụ ọrụ n'ụzọ dị iche iche, iji mee ka ọnọdụ kawanye mma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.