Ụgbọelu Atọ Awụchaala n'Ọdụ Ụgbọelu Ọhụrụ Anambra

May 4, 2021 - 17:52
 0
Ụgbọelu Atọ Awụchaala n'Ọdụ Ụgbọelu Ọhụrụ Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ụzụ tụrụ, mkpu ọñụ dàkwàrà na nsonso a, dịka ụgbọelu atọ wụchàrà n'ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ a rụrụ ọhụrụ na steeti Anambra.

Mwụcha ụgbọelu atọ ahụ bụ nke mere n'isi ngwụcha izuụka gara aga, ma bụrụkwa nke ọtụtụ mmadụ gbakọrọ n'ebe ahụ ụbọchị ahụ ịnabata ụgbọelu ahụ kọwàrà dịka ihe obi ụtọ, ihe inye Chineke otuto, na ihe ikele aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ n'ụzọ pụrụ iche, maka ọmarịcha agadaga ọrụ ahụ ọ rụrụ n'ebe ahụ.

N'ime ụgbọelu atọ ahụ wụchara n'ebe ahụ, abụọ n'ime ha bụ nke Maazị Allen Onyema, bụ onyeisi ụlọọrụ 'Air Peace', ma bụrụkwa nwaafọ steeti Anambra; ebe nke ọzọ bụkwa nke nwaafọ steeti Anambra ọzọ na-ewu èwù n'ihe gbasaara azụmahịa, bụ Maazị Ernest Obiejesi. Maazị Onyema bụ onye mbụ ụgbọelu ya, bụ 'Boeing 737 N5-BUJ' tụrụ ụkwụ n'ala n'ọdụ ụgbọelu ahụ oge o jiri nkeji iri abụọ na isii wee gaa elekere abụọ nke ehihie.

N'okwu ya n'ọdụ ụgbọelu ahụ, nke a rụrụ n'Ụmụeri, n'okpuru ọchịchị ime obodo Anambra East; Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na ọ rụrụ ọdụ ụgbọelu ahụ n'ime ọnwa iri na ise, ma kọwaa ya dịka ihe ga-etute nglaba njem ụgbọelu na ọnọdụ akụnụba steeti ahụ nà nke mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ n'izugbe.

Dịka o siri kọwaa, ọdụ ụgbọelu ahụ nwèrè mpaghara 'runway' ogologo ya ruru kilomita 3.7, ụlọelu tawà (tower) nwere òkpùkpù iri na otu, eprọn (apron) ogologo ya ruru narị atọ, tinyere akụrụngwa ndị ọzọ mere ya ka ọ bụrụ ọkachamma na ejiamaatụ n'ala Nigeria na mba ọwụwa anyanwụ Afrịka. Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmenti ya ébìghì ego ọbụla wee rụọ ọdụ ụgbọelu ahụ, ma kwuo na a kwụchaala ụgwọ akụrụngwa niile a ga-eji wee rụtọpụ ihe ndị ọzọ fọrọ afọ ebe ahụ.

O chétààrà Ndị Anambra na o ruola ihe karịrị ahọ iri atọ e siri tụba anya ịrụ ọdụ ụgbọelu na steeti ahụ, mana o nweghị nke ọbụla n'ime ha mịtara mkpụrụ, wee ruo ugbua ọ batara n'ọkwa ọchịchị wee rụọ nke ahụ bụ ejiamaatụ. Ọ kpọpụtasịrị ụzọ dị iche iche ọdụ ụgbọelu ahụ ga-esi nye aka n'ịkwàlite mmepe obodo, ma mee ka a mara na ọ ga-ekewapụta ohere ọrụ karịrị puku ise, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ ọ ga-eweta.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ 'Air Peace', bụ Maazị Allen Onyema, onye soro ụgbọelu nke mbụ dara n'ebe ahụ wee wụchaa, kọwàra ọdụ ụgbọelu ahụ dịka nke kachaa wee buo ibu ma nwekwa akụrụngwa bụ ejiamaatụ na mba Afrika niile, ma kelee gọọmenti etiti ala Nigeria maka ịnabata ọdụ ụgbọelu ahụ n'egbughị oge ọbụla.

O mere ka a mara na anyammiri ọñụ pụtàrà ya n'anya ozigbo ọ wụchara n'ọdụ ụgbọelu ahụ, n'ihi na nrọ ahụ a rọbara kemgbe emechaala pụta ìhè, ọbụladị dịka o kelere Gọvanọ Obianọ, Ndị Anambra na ndị ọzọ gbara mbọ n'ụzọ dị iche iche ime ka nrọ ahụ pụta ihè.

Na mbụ n'okwu ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti Anambra, bụ Maazị Marcel Ifejiofor kwupụtara obi ụtọ ya na emezuputala ebumnobi ịrụ ọdụ ụgbọelu ahụ, ọkachasị n'okpuru ya ugbua ọ nọ n'ọkwa dịka Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, ma kelee Gọvanọ Obianọ maka ọhụhụ-ụzọ ya na ezi ebumnobi ya n'ebe Ndị Anambra nọ.

Mmemme ahụ dọtara ọtụtụ, ma bụrụkwa nke aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ na ya wee nye Maazị Allen Onyema na ndị ọrụ ụgbọelu soro ụgbọelu ahụ wee wụchaa ebe ahụ ụbọchị ahụ onyinye dị iche iche, tinyere otu onye n'ime ndị ahụ nyara ụgbọelu wee bịa ebe ahụ, bụ Nwaada Nwando Okpalaeke, ma bụrụkwa nwaafọ Azia, dị n'okpuru ọchịchị Ihiala nke steeti Anambra.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484