Ụgbọelu Mbụ Ga-Awụcha n'Ọdụ Ụgbọelu Anambra n'Epure 30 —Obiano

Apr 21, 2021 - 19:25
 0
Ụgbọelu Mbụ Ga-Awụcha n'Ọdụ Ụgbọelu Anambra n'Epure 30 —Obiano

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-abụ a rụchaa ụlọ e mepeghị ya emepe, ọ dị ka ọ bụ ahụhụ na arịrị ka a rụụrụ.

N'ihi nke ahụ, gọọmentị steeti Anambra ekwupụtala na steeti ahụ adịla njikere ịnabata ụgbọelu mbụ n'ọdụ ụgbọelu steeti ahụ a rụrụ ọhụrụ. 

Nke a bụ nke e kwupụtara site n'ọnụ Gọvanọ Willie Obianọ, bụ aka na-achị steeti ahụ, n'okwu ya oge ọ gara njem nleta n'ọdụ ụgbọelu ahụ, bụ nke a rụrụ n'Ụmụeri, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East'. 

Njem ahụ Gọvanọ Obianọ gara ebe ahụ bụ nke nwunye ya bụ Ebelechukwu Obiano, ndị eze ọdịnala obodo, na ụfọdụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ sòrò ya wee gaa n'isi ngwụcha izuụka gara aga. 

Otu nwaafọ steeti Anambra na-ewu èwù n'ihe gbasara azụmahịa ma bụrụkwa onye obodo Ọkịja, bụ Dọkịta Earnest Obiejesi bùkwàrà ụgbọelu Helikọpta ya wee wụchaa n'ebe ahụ ụbọchị ahụ.

Dịka ọ na-agba akaebe na ọdụ ụgbọelu ahụ ga-enye aka n'ịkwalite ọnọdụ akụnụba na ọnọdụ mmepe mpaghara steeti Anambra n'izugbe, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ nke ahụ ga-ewèta; Gọvanọ Obianọ mèkwàzịrị ka a mara na ịrụcha ọdụ ụgbọelu ahụ bụ mmezupute otu n'ime nkwa dị iche iche o kwere Ndị Anambra, ma mekwazie ka a mara na ọchịchị ya ga-emezucha nkwà niile o kwere ụmụafọ steeti ahụ tupu ọchịchị ya arịtuo n'ọkwa na steeti ahụ.

Ọ kpọkukwazịrị ndị Anambra ka ha gaa n'ihu inye ọchịchị ya nkwàdo, iji gaa n'ihu imezùputè nkwà dị iche icheo kwere ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484