Ụlọ Etigbuola Otu Obere Nwa n'Ọnịtsha

Apr 9, 2020 - 04:08
Jan 22, 2021 - 21:36
 0
Ụlọ Etigbuola Otu Obere Nwa n'Ọnịtsha

Izunna Okafor, Awka

Anyammiri na mkpu akwa wàrà n'Ọnịtsha na nso nso a, dịka otu ụlọ dàrà wee tipịa isi otu nwatakịrị na mpaghara 47 Modebe Street. Dịka akụkọ siri kọọ, ọ bụ mpaghara ebe a wụrụ awụ n'ụlọ ahụ bụ ihe dara, wee tipịa nwata ahụ isi.

Nke a bụzị nke mere ka ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ n'ihe gbasaara ewumewu ụlọ garuo n'ebe ahụ ya bụ njinji nọrọ wee jie, ma nọrọkwazie n'ebe ahụ kaa ụlọ ahụ akara nkụtù.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Physical Planning Board' bụ Maazị Chike Maduekwe kọwara nke ahụ dịka ihe ịgba anyammiri, ma sịkwa na steeti ahụ agaghị anagide maọbụ leghara ihe dị etu ahụ anya.

O kpebikwazịrị ma kwuwaa na a ga-akụtù ya bụ ụlọ, dịka o siri dị n'atụmatụ iwu gọọmenti steeti ahụ wepụtara banyere ihe dị etu ahụ.

Ka ọ dị ugbua, ndị uwe ojii anwụchikọọla onye nwe ya bụ ụlọ, ebe nnyocha ka na-agakwa n'ihu banyere nke ahụ, nke mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ya ụlọikpe, ebe a ga-enye ya ntamahụhụ ruru ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.