Ụlọọrụ FRSC Ga-amalitezị Ijide Ụgbọala Buru Óké Íbū n'Anambra

Jul 22, 2020 - 17:21
Jan 26, 2021 - 17:22
 0
Ụlọọrụ FRSC Ga-amalitezị Ijide Ụgbọala Buru Óké Íbū n'Anambra

By Izunna Okafor

N'ịkwalitekwu ọrụ ya na mbọ ahụ ọ na-agba ibelata ihe mberede okporo ụzọ, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ije awele okporo ụzọ, bụ ụlọọrụ Federal Road Safety Corps (FRSC), ngalaba ya nke steeti Anambra, agbapeela atụmatụ ọrụ ọhụụ pụrụ iche, megide nnukwu ụgbọala na-ebu oke íbū nakwa ndị ọzọ na-ada iwu okporo ụzọ dị iche iche.

Dịka ozi si n'aka onye na-ahụ maka nkuzi na mgbasaozi n'ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Pascal Anigbo siri kọwaa, ya bụ atụmatụ ọhụụ a gbapere na nsonso a site n'aka onyeisi ụlọọrụ ahụ na steeti ahụ, bụ Maazị Andrew Kumapayi, metụtàrà ndị na-anya Tipà maọbụ nnukwu ụgbọala ndị ọzọ buru óké íbū maọbụ dàá iwu okporo ụzọ.

Dịka o siri kọwaa, atụmatụ ọhụrụ ahụ gbasòrò ntụziaka Gọvanọ Willie Obianọ nyèrè ma bụrụkwa nke gbadoro ụkwụ na mkpebi 13, 2020 ahụ ndị ụlọ omeiwu steeti Anambra mere, bụ nke nyere ụlọọrụ FRSC ahụ ntụziaka ka ọ welitekwuo aka n'ọrụ ibelata oke ihe mberede okporo ụzọ na-emegasị na steeti ahụ, iji chekwaa ndụ ndị na-anyà ụgbọala na ndị na-aga n'okporo ụzọ.

Ọ dị ncheta na onyeisi ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Kumapayi nọrọ n'ime izuụka abụọ gara aga wee nwee nzukọ mkparịta ụka, ya na ndị na-anyà Tipà n'ime steeti ahụ, bụ ebe ọ nọrọ wee dọọ ha aka na ntị banyere etu ha si eweta ihe mberede n'okporo ụzọ, dụọ ha ọdụ ka ha rụọ ụgbọala ha nke ọma, dọọ ha aka na ntị banyere ịgba oke ọsọ, ma gwakwa ha bànyere atụmatụ ọhụụ ahụ n'oge, tupu a gbapee ya.

Ya mere, ka òhèrè mkpụrụ izuụka abụọ ahụ o nyere ha gachara, ọ nọzịrị na nsonso a wee gbapee ya bụ atụmatụ ọrụ, nke pụtazịrị na ndị ụlọọrụ ahụ ga-amalitezị ịnwụchikọ ụgbọala ọbụla buzị oke ibu, nke nwegasịrị ọkụ ekwesi ekwesi, nke enweghị akwụkwọ ikike, ndị na-añụ mmanya na-aba n'anya maọbụ kpọọ ọgwụ ike tupu maọbụ mgbe  ha na-anya ụgbọala, ndị na-anya nnukwu ụgbọala n'erughị ogo ịnyà ya, tinyere ndị dara iwu okporo ụzọ ndị ọzọ. Ya bụ atụmatụ bụkwa nke a ga-etinye n'ọrụ ma mezupụta na mpaghara niile nke steeti ahụ.

Ndị ọzọ sonyere na mmemme ịgbape atụmatụ ahụ gụnyere Kọmishọna na-ahụ maka njem okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ Maazị Afam Mbanefo; onyeisi ụlọọrụ 'Anambra Transport Management Agency' bụ Maazị Pat Obiefuna; tinyere ndị ụlọọrụ 'Vehicle Inspection Officer (VIO)', ndị ọrụ 'Directorate of State Security (DSS)', ndị ọrụ 'National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)' na ndị ọrụ 'Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC)'.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.